Jeremaya31ibo_bib
1“Nʼoge ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.”2Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,“Ndị ahụ gbanarịrị mma aghaga-ahụta ihuọma nʼọzara.Aga m abịa iwetara Izrel izuike.”3Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị,“Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya;Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso.4Aga m ewulikwa gị elu ọzọ,e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke.Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọsoro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.5Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogigenʼelu ugwu Sameria.Ndị ọrụ ubi kụrụ yaga-erikwa mkpụrụ si na ya.6Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọnʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha,‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn,ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’ ”7Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,“Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb,tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu.Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ,‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị,bụ ndị Izrel fọdụrụ.’8Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha;aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha.Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ,na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme.Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!9Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta,ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha.Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi,nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha,nʼihi na aghọọlara m Izrel nna,Ifrem bụkwa ọkpara m.10“Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile;kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile.Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha.Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.11Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb,ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike.12Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ,ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha,dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ,na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi.Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile;ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ.13Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ,ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ.Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ,aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.14Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta,afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,”otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.15Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru,“A nụrụ otu olu na Rema,iru ụjụ na oke ịkwa akwa.Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya,o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya,nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.”16Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru,“Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa,jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri,nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.”Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.“Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa.17Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.“Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.18“Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị,‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike.Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị.Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa,nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.19Mgbe m kpafuru,echegharịrị m.Mgbe m ghọtakwara,e tiri m aka nʼobi m,ihere mere m, ọ wutekwara mnʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’20Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke,onye ihe ya na-atọ m ụtọ?Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya,ma anọkwa m na-echeta ya.Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike.Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.”Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.21“Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama,manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama.Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile,bụ okporoụzọ unu ga-eso.Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke,laghachi nʼobodo gị ndị a.22Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị,gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel?Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa;nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.”23Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’24Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha.25Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.”26Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.27Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda.28Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.29“Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa,“ ‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha,ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’30Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.31“Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,“mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrịnʼetiti mụ na ụlọ Izrel,nakwa ụlọ Juda.32Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụmụ na nna nna ha gbara,mgbe ahụ m jidere ha nʼakasite nʼala Ijipt dupụta ha,nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m,ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,”Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.33“Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agbamgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara.“Aga m etinye iwu m nʼime obi ha,aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha.Aga m abụ Chineke ha,ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.34Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe,maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ,site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.“Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha,agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”35Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,bụ onye ahụ họpụtara anyanwụmee ka ọ na-enye ihe nʼehihie,onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwuka ha na-enye ihe nʼanyasị,onye na-akpali oke osimiri,na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ.Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.36Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,“Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa,ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị,ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.”37Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,“Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe,na ịdị omimi nke ntọala ụwa,ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel,nʼihi ihe niile ha mere.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.38“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ.39Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa.40Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye Onyenwe anyị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”