1“Ahụhụ dịrị ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-achụsasị, ma na-ebibi igwe atụrụ m ha kwesiri ilekọtazi anya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.2Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel na-agwa ndị ọzụzụ atụrụ ahụ na-elekọta ndị m, “Ebe ọ bụ na unu akpasasịala igwe ewu na atụrụ m, chụsaa ha, kama ilekọtazi ha anya nke ọma, aga m ata unu ahụhụ nʼihi ihe ọjọọ ndị a unu mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.3“Mụ onwe m ga-eji aka m chịkọta ndị m fọdụrụ nʼigwe ewu na atụrụ m site na mba ahụ niile m chụgara ha, kpọghachikwa ha nʼebe ịta nri ha, ebe ha ga-anọ mụbaa, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ.4Aga m ahọpụtakwa ndị ọzụzụ atụrụ, ndị ga-elekọtazi ha anya. Egwu agaghị atụ ha, ọ dịkwaghị onye ga-emenye ha ụjọ. O nwekwaghị onye ga-akpafu akpafu nʼime ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.5“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara,“mgbe m ga-eme ka Ngalaba na-eme ezi omume bilie nʼezinaụlọ Devid.Ọ ga-abụ Eze ga-eji amamihe chịa ndị ya.Ọ ga-eme ezi ihe, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.6Nʼụbọchị, ya ka a ga-azọpụta Juda,Izrel ga-ebikwa nʼudo.Nke a bụ aha a ga-akpọ ya:Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ Ezi omume Anyị.7“Nʼihi nke a, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe ndị mmadụ na-agaghị asịkwa ọzọ, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye sitere nʼala Ijipt dupụta ndị Izrel,’8ma ha ga-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, bụ onye ahụ kpọlatara agbụrụ Izrel site nʼala dị nʼugwu, na mba dị iche iche ebe ọ chụgara ha.’ Mgbe ahụ, ha ga-ebi nʼala nke aka ha.”
Ndị amụma ụgha.
9Ma banyere ndị amụma,obi m na-agbawa nʼime m,ọkpụkpụ m na-amakwa jijiji nʼihi ha.Adị m dịka nwoke mmanya na-egbu,dịka onye ṅụbigara mmanya oke,nʼihi ihe na-eche ha site nʼaka Onyenwe anyị,na site nʼokwu nsọ ya.10Ndị jupụtara nʼala a bụ ndị na-akwa iko.Nʼihi ịbụ ọnụ ndị a niile ala a tọgbọrọ nʼefu,ahịhịa niile dị nʼọzara akpọnwụọla.Ndị amụma na-agbasokwa ihe ọjọọ.Ha na-egosikwa ike ha nʼụzọ na-ezighị ezi.11“Nʼihi na ndị amụma na ndị nchụaja aghọọla ndị na-amaghị Chineke.Ọ bụladị nʼime ụlọnsọ ukwu m ka m na-ahụ ajọ omume ha.”Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.12“Nʼihi ya, ụzọ ha na-agbaso ga-adị ka ebe na-amị amị;a ga-achụbanye ha nʼọchịchịrịebe ahụ ka ha ga-anọkwa daa.Aga m eme ka ihe mbibi bịakwasị hanʼafọ ahụ, a ga-ata ha ahụhụ.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.13“Ahụrụ m ihe arụnʼetiti ndị amụma Sameria:Ha buru amụma site nʼike chi Baal,si otu a duba ndị m, bụ Izrel na mmehie.14Ahụkwara m ihe jọgburu onwe yanʼetiti ndị amụma nọ na Jerusalem.Ha na-ebi ndụ ịkwa iko, na ikwu okwu ụgha.Ha na-agba ndị ajọ omume ume,si otu a na-egbochi ha isi nʼihe ọjọọ ha tụgharịa.Ha niile dịka ndị Sọdọm nʼebe m nọ;ndị Jerusalem dịkwa ka ndị Gọmọra nʼihu m.”15Nʼihi nke a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru banyere ndị amụma a,“Aga m eme ka ha rie nri na-akụ ilu,meekwa ka ha ṅụọ mmiri e tinyere nsi,nʼihi na mmụọ nke amaghị Chineke esitela nʼaka ndị amụma nọ na Jerusalemgbasaa ruo ndị niile bi nʼala ahụ.”16Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru,“Unu aṅala ntị nʼihe ndị amụma ahụ na-eburu unu nʼamụma,nʼihi na olileanya ha na-ewetara unu abụghị ezi olileanya.Ọhụ ha na-agwa unu na ha hụrụ bụ ihe ha chepụtara nʼobi ha,o sighị nʼọnụ Onyenwe anyị rute ha17Ha na-anọgide na-agwa ndị ahụ na-elelị m anya na-asị ha,‘Onyenwe anyị kwuru sị, unu ga-enwe udo.’Ndị ahụ niile na-agbasokwa ụzọ isiike nke obi ha tụpụtara,ka ha na-agwakwa okwu sị, ‘O nweghị ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị.’18Ma olee onye ọ bụ nʼetiti ndị amụma a nke na-abịaru Onyenwe anyị nso,hụ ya anya maọbụ ịnụ ihe ọ na-ekwu?Onye kwa nʼetiti ha nwerela ike ṅaa ntị nụrụ okwu ya?19Lee, Onyenwe anyị na-ezite oke ifufe na-efesi ike,ọ bụ oke ifufe nke iwe ya,nke ga-abịabufuo ndị ajọ omume a.20Onyenwe anyị agaghị akwụsị iwe iwe yatutu ruo mgbe o mezuruihe niile dị ya nʼobi.Nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa nʼihu,unu ga-aghọta ihe ndị a niile nke ọma.21Ọ bụghị m zitere ndị amụma a,ma ha na-ekwu na ọ bụ okwu si m nʼọnụ ka ha na-ekwu.O nwebeghị oge m ji gwa ha okwu,ma ha nọkwa na-ebu amụma.22A sị na ha abịala nso guzo nʼebe ịgba izu nzuzo m,ha gaara ekwusara ndị m okwu m,nke gaara eme ka ha site nʼajọ omume ha tụgharịa,sitekwa nʼụzọ ọjọọ ha chigharịa.23“Abụ m naanị Chineke na-anọ ha nso,ma adịghị m anọ nʼebe dị anya?”Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.24“O nwere onye pụrụ izo onwe ya nʼebe nzuzonke m na-enweghị ike ịhụ anya?”Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.“Ọ bụ na m anọghị nʼebe niile nʼeluigwe nakwa nʼụwa?”Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.25“Anụla m ka ndị amụma a, bụ ndị na-ebu amụma ụgha nʼaha m na-ekwu na-asị, ‘Arọrọ m nrọ! Arọrọ m nrọ!’26Ruo ole mgbe ka ihe dị otu a ga-adịgide nʼobi ndị amụma ndị a, ndị na-ebu amụma aghụghọ dị ha nʼobi?27Ha na-eche na nrọ ha na-akọrịtara ibe ha ga-eme ka ndị mmadụ chezọọ aha m, dịka ndị nna nna ha si chezọọ aha m site nʼịkpọ isiala nye Baal.28Ka onye amụma ahụ rọrọ nrọ kọgharịa nro ọ rọrọ. Otu a kwa, ka onye ahụ okwu m dị nʼọnụ ya nọgidekwa na-ekwusa ya nʼeziokwu. Nʼihi na gịnị ka okporo ọka na mkpụrụ ọka nwekọrọ?” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.29“Okwu m ọ dịghị ka ọkụ? Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara,Okwu m ọ dịkwaghị ka okporo igwenke na-etiwasị nkume?”30Nʼihi ya, Onyenwe anyị kwubiri sị, “Ana m edo onwe m megide ndị amụma na-esite nʼọnụ ibe ha na-ezute okwu ha na-ekwu, ma na-asị na ọ bụ nʼọnụ m ka ha si nata ya.31E, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, Ana m edo onwe m megide ndị amụma ahụ ire ha na-ekwu ọtụtụ okwu, ndị ahụ na-asịkwa, ‘Ọ bụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.’32Nʼezie, ana m edo onwe m megide ndị ahụ niile na-ebu amụma nro ụgha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ji okwu ụgha ha na-agwa ndị m okwu, na-eduhie ha, ma ọ bụghị m họpụtara ha. Ọ bụkwaghị m zitere ha. Okwu ha adịghịkwa abara ndị m uru ọbụla.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Ndị amụma ụgha na ịjụ ase ụgha.
33“Mgbe ndị a, maọbụ ndị amụma ha, maọbụ ndị nchụaja ha, jụrụ gị ajụjụ sị gị, ‘Gịnị bụ ozi i si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’ Ị ga-asa ha sị, ‘Ozi nke ole?Aga m agbakụta unu azụ, ya bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.’34Ọ bụrụ na onye amụma maọbụ onye nchụaja maọbụ onye ọbụla ọzọ ekwuo sị, ‘Ihe dị otu a bụ ozisi nʼọnụ Onyenwe anyị,’ aga m ata onye ahụ kwuru okwu ahụ na ndị ezinaụlọ ya ahụhụ.35Ihe ndị a bụ ihe unu na-agwarịta onwe unu nʼotu nʼotu. Ọ bụ ihe enyi na-agwa enyi ya, na ihe nwanna na-agwa nwanna Izrel ibe ya. Unu na-asị, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere?’ maọbụ, ‘Gịnị bụ okwu e si nʼọnụ Onyenwe anyị nata?’36Kwụsịnụ ịjụgharị ajụjụ banyere ihe Onyenwe anyị kwuru, nʼihi na okwu onye ọbụla nʼime unu kwuru na-aghọrọ onye ahụ ihe si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. Site nʼụzọ dị otu a unu na-agbanwe ma na-asụgharịkwa okwu Chineke dị ndụ isi, bụ okwu Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, onye bụ Chineke anyị.37Ihe ndị a niile bụ ihe unu na-ajụkarị onye amụma, ‘Gịnị bụ ọsịsa Onyenwe anyị nyere gị? Maọbụ, gịnị ka Onyenwe anyị kwuru?’38Ọ bụ ezie na unu na-ekwu sị, ‘Ihe ndị a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ma lee ihe Onyenwe anyị na-ekwu: Unu na-ekwu okwu ndị a, ‘Ihe a bụ ozi si nʼaka Onyenwe anyị,’ ọ bụladị mgbe m gwarala unu si unu asịkwala ‘Ihe ndị a bụ ozi nʼaka Onyenwe anyị.’39Ya mere, mụ onwe m ga-echezo unu kpamkpam ma sitekwa nʼihu m chụpụ unu na obodo a nke m nyere unu na nna nna unu ha.40Aga m eme ka ịta ụta ebighị ebi bịakwasị unu. Aga m etinyekwa unu nʼọnọdụ ihere nke ga-adịgide ruo ebighị ebi, e, ọnọdụ ihere nke a na-agaghị echefu echefu.”