Jeremaya17ibo_bib
1“E ji mkpisi igwe gbunye mmehie Juda,jikwa ọnụ nkume siri ike a pịrị ọnụ ya apị,depụta nʼelu mbadamba nkume, bụ obi ha,nakwa nʼelu mpi niile nke ebe ịchụ aja ha.2Ọ bụladị ụmụ ha na-echeta ebe ịchụ aja ha,na ogidi a manyere nʼala nʼihi arụsị Ashera,nke dị nʼebe ọtụtụ osisi ndụ na-etokọ ọnụ,ma nʼelu ugwu nta niile.3Ugwu m, nke dị nʼala ahụ,na ihe niile ha nwere, na akụnụba haka m ga-eweta nye ndị ga-adọta ha nʼagha.Aga m enyekwa ha ihe niile ahụ dị nʼelu ugwu,nʼihi mmehie gị, nke jupụtara nʼala gị niile.4Ihe nketa ahụ m nyere gị ga-efunarị gị,nʼihi ihe i ji aka gị wetara onwe gị.Aga m emekwa ka ị bụrụ ohu ndị iro gịnʼala nke ị na-amaghị,nʼihi na ị kpasuola iwe m,ọ ga-adịgidekwa ruo mgbe niile ebighị ebi.”5Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-atụkwasị mmadụ ibe ya obi,onye olileanya ya dị nʼinyeaka ga-esi nʼaka mmadụ rute ya aka,onye wezugara obi ya site nʼebe Onyenwe anyị nọ.6Onye ahụ ga-adị ka osisi na-eto nʼala tọgbọrọ nʼefu.Ọ gaghị ahụkwa mgbe ọ dịmma na-abịara ya.Ọ ga-ebi nʼebe niile kpọrọ nkụ nke ọzara,nʼala nnu nnu, ebe ndị mmadụ na-ebighị.7“Ma ngọzị na-adịrị onye ahụ na-atụkwasị Onyenwe anyị obi ya.Onye ịnya isi ya bụ nʼime Onyenwe anyị.8Onye dị otu a ga-adị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,nke mgbọrọgwụ ya na-awasa banye nʼiyi ahụ.Ụjọ adịghị atụ ya nʼoge okpomọkụ,akwụkwọ ndụ na-adịgidekwa nʼelu ya.Ọ dịghị echegbu onwe ya nʼafọ ụnwụ dị.Ọ dịkwaghị mgbe ọ na-akwụsị ịmị mkpụrụ.”9Obi mmadụ dị aghụghọ karịa ihe niile,o nwekwaghị ngwọta.Onye pụrụ ịghọta ya?10“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-enyocha obi,na-anwụpụta ihe dị nʼime mmụọ,nʼihi ịkwụ mmadụ ụgwọ dịka ọrụ ya si dị,na dịka ihe ruuru ya si dị nʼihi ọrụ ya.”11Dịka ọkwa si ekpokọba akwa ọ na-eyighị,otu a ka ndị na-akpakọba akụ nʼụzọ na-ezighị ezi dị.Nʼetiti ụbọchị ndụ ha, akụ ndị a ga-efunarị ha.Nʼikpeazụ ha ga-aghọ ndị nzuzu.12Ocheeze dị ebube, nke e mere ka ọ dị elu site na mmalite,ka ebe nsọ anyị bụ.13Onyenwe anyị, olileanya Izrel ka ị bụ.A ga-emekwa ka ihere mee ndị na-agbakụta gị azụ.A ga-edekwa aha ndị ahụ niile si nʼebe ị nọ wezuga onwe ha nʼala,nʼihi na ha ewezugala onwe ha site nʼebe Onyenwe anyị,isi iyi nke mmiri na-enye ndụ, nọ.14Onyenwe anyị, ọ bụrụ na i mee ka ahụ sie m ike aga m adị ndụ.Ọ bụrụ na ị zọpụta m aga m abụ onye azọpụtara,nʼihi na ọ bu naanị gị ka m na-eto.15Ha nọ na-ajụ m ọnụ, na-asị m,“Olee ebe okwu Onyenwe anyị dị?Ya mezuonụ ugbu a!”16Ma esitebeghị m na ị bụ onye ọzụzụ atụrụ gị wezuga onwe m.Ị maara na ọ bụghị ọchịchọ obi m ịhụ ụbọchị ahụ na-eweta ịda mba.Ị maara ụdị okwu niile na-esite nʼọnụ m na-apụ.17A ghọrọla m ihe na-eyi egwu,nʼihi na ị bụ ebe mgbaba m nʼụbọchị mbibi.18Mee ka ihere mee ndị na-akpagbu m.Ekwekwala ka ihere mee m.Mee ka ha tụọ ụjọ,ma chebe m site nʼihe egwu.Mee ka ụbọchị mbibi bịakwasị ha,werekwa okpukpu ihe mbibi abụọ tipịa ha.