Aịzaya9ibo_bib

A mụụrụ anyị otu nwa

1Ma otu ọbụla o siri dị, oge ahụhụ na ọchịchịrị na iru ụjụ ahụ agaghị adịgide nye ndị ahụ nọ na nkpa. Nʼihi na nʼoge gara aga, o mere ka e lelịa ala Zebụlọn na ala Naftalị anya, ma nʼoge dị nʼihu, ọ ga-eme ka a asọpụrụ Galili nke mba niile, nke dị nʼakụkụ osimiri, nʼofe Jọdan.2Ndị nọ na-agagharị nʼọchịchịrịahụla ìhè dị ukwuu;ndị ahụ bi nʼala nke onyinyo ọnwụka ìhè nwukwasịrị.3I meela ka mba ahụ baa ụba dịrị ukwuu,mee ka ọṅụ ha dịkwa ukwuu,ha na-enwe ọṅụ nʼihu gị,dịka ọṅụ nke ndị ọrụ ubi nʼoge owuwe ihe ubi,dịka ndị agha na-etegharị egwu ọṅụmgbe ha na-ekesa ihe a kwatara nʼagha.4Nʼihi na dịka nʼụbọchị nke Midia,i gbajisielaibu arọ niile e bokwasịrị ha,ihe mgbochi nke dị nʼubu ha,nke bụ mkpara ndị na-akpagbu ha.5Nʼihi na akpụkpọụkwụ nke ndị agha na-eyi,na uwe agha nke ọbara mechuru,ha ga-abụ ihe a ga-agba ọkụ,ha ga-abụ ihe ndị ga-eme ka ọkụ ree nke ọma.6Nʼihi na amụọrala anyị otu nwa,e nyekwala anyị otu nwa nwoke.Ọ ga-abụkwa onye ga-achị anyị.Ndị a ga-abụ aha ya,Onye Ndụmọdụ dị Ebube, Chineke bụ dike,Nna nke mgbe ebighị ebi, Eze Udo.7Alaeze ya ga-aba ụba, ọchịchị eze ya ga-abụ nʼọnọdụ udonke na-enweghị ọgwụgwụ.Ọ bụ nʼocheeze Devid ka ọ ga-anọkwasị,chịakwa nʼalaeze ya.Ọ ga-eme ka alaeze ahụ guzosie ike;ọ bụkwa ikpe ziri ezi na ezi omume ka ọ ga-eji chịasite nʼoge ahụ ruo mgbe ebighị ebi.Ịnụ ọkụ nke Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,ga-emezukwa nke a.

Iwe Onyenwe anyị megide Izrel

8Onyenwe anyị eziela ozi megide Jekọbọ ga-adakwasịkwa Izrel.9Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya,Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwabụ ndị na-eji ngangana mpako na-ekwu sị,10“Nkume brik ndị ahụ adakpọsịalama anyị ga-eji nkume a waziri awazi wughachi ha;ọ bụ ezie na e gbutusịala osisi sikamọ niile anyị ji wuo ụlọ anyị,ma anyị ga-eji osisi ọma sida dochie ha.”11Ma Onyenwe anyị a kpaliela ndị iro Rezin ka ha bilie megide ha,ọ kwaliekwala ndị iro ha.12Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel.Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
13Ma ọ bụ ezie na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ataala ha ahụhụ dị otu a,ndị Izrel echegharibeghị, ha alọghachikwutebeghị ya.14Nʼihi ya, nʼotu ụbọchị, Onyenwe anyị ga-ebibi ndịisi Izrel na ndị ọdụdụ,ọ ga-ebibikwa alaka nkwụ na osisi achara niile.15Ndị okenye na ndị a maara aha ha bụ ndịisi ha,ndị amụma ụgha bụ ọdụdụ ha.16Nʼihi na ndị ndu nke ndị ya eduhiela ha;ndị na-ezi ha ụzọ emeela ka ha kpafuo.17Ya mere, Onyenwe anyị agaghị enwe mmasị nʼụmụ okorobịa ahụ,ọ gaghị enwekwa obi ebere nʼebe ụmụ ndị na-enweghị nna maọbụ nʼebe ụmụ nwanyị na-enweghị dị nọ,nʼihi na onye ọbụla nʼime ha adịghị asọpụrụ Chineke, bụrụkwa ndị ajọ omume,ọnụ onye ọbụla na-ekwu ihe nzuzu.Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,aka ya ka setịpụkwara esetipụ.
18Nʼezie, ajọ omume na-ere dị ka ọkụ:ọ na-erepịa ogwu na uke,ọ na-emekwa ka oke ọhịa nwuru ọkụ,mee ka anwụrụ ọkụ si na ya rigoruo na mbara eluigwe.19Nʼihi iwe ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ewe,ahụhụ ọ ga-enye ga-adị ka ọkụ na-ere ere;ọ na-erepịa ala ahụ niile na ndị bi nʼime ya;ọ dịkwaghị onye ga-azọpụta ibe ya.20Nʼala ahụ niile, ma nʼaka nri ma nʼaka ekpe,onye ọbụla ga-agbalị ịdọtara onwe ya ihe oriri.Ha ga-erima afọ agaghị eju ha;nʼezie, ha ga-eri ọ bụladị anụ ahụ ụmụ nke aka ha.21Ndị Manase ga-alụso ndị Ifrem ọgụ, ndị Ifrem ga-alụsokwa ndị Manase ọgụ.Ha abụọ kwa ga-ejikọta aka lụso Juda ọgụ.Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ.Aka ya ka setịpụkwara esetipụ.