1Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu,“Eluigwe bụ ocheeze m,ụwa bụkwa ebe mgbakwasị ụkwụ m.Ọ bụ ụdị ụlọ gịnị ka ị ga-ewuru m?Ebee ka ebe izuike m ga-adị?”2Ọ bụghị aka m mere ihe ndị a niile,mee ka ha ji dịrị?Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.“Ma olee ndị ihe ha na-atọ m ụtọ,ọ bụ ndị ahụ nwere obi umeala, ndị na-adịghị ebuli onwe ha elu,ndị na-amakwa jijiji nʼokwu m.3Ma onye ọbụla nke na-achụ aja ehidịka nwoke na-egbu mmadụ,onye ọbụla jikwa nwa atụrụ achụ ajadị ka onye na-agbaji nkịta olu,onye ọbụla na-achụ aja mkpụrụ ọkadị ka onye na-eche ọbara ezi,otu a kwa, onye ọbụla na-esure ụda na-esi isi ụtọ nke nchetadị ka onye na-efe arụsị.Ha ahọpụtarala onwe ha ụzọ nke ha,ha na-enwekwa mmasị nʼihe arụ ha niile.4Ya mere, aga m ezitere ha ahụhụ dị egwu,mee ka ihe ahụ ha na-atụ egwu ya bịakwasị ha.Nʼihi na mgbe m kpọrọ ha oku, ha azaghị,mgbe m gwara ha okwu, ha egeghị ntị.Kama ha mere ihe ọjọọ nʼihu m,họrọkwa ime ihe ndị ahụ ha maara na m kpọrọ asị.”5Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị,unu ndị na-ama jijiji nʼokwu ya,“Ụmụnna unu, ndị kpọrọ unu asị,ndị chụpụkwara unu nʼihi aha m, ekwuola sị,‘Ka a sọpụrụ Onyenwe anyị!Ka anyị lee ụdị ọṅụ ga-abụ nke unu!’Ma a ga-etinye ha nʼọnọdụ ihere.6Ọ bụ gịnị bụ mkpọtụ dị nʼime obodo?Gịnị bụ oke ụzụ na-ada nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?Ọ bụ ụzụ Onyenwe anyị na-eme.Onye ahụ na-akwụghachi ndị iro ya ụgwọ ruuru ha.7“Tupu ime amalite ime ya,ọ mụpụtalarị nwa ya.Tupu ihe mgbu ya ebido,ọ mụpụtala nwa nwoke.8Onye jiri ntị ya nụtụ ihe dị otu a mbụ?Onye kwa ji anya ya hụ ihe dị otu a?A pụrụ ịmụpụta otu mba nʼotu ụbọchị?Ka e nwere ike ime ka otu obodo malite ịdị nʼotu ntabi anya?Lee na tupu ihe mgbu nke ọmụmụ nwa ya ebidoZayọn amụpụtala ụmụ ya.9Mụ onwe m, m ga-eme ka nwa rute nʼoge ọmụmụgharakwa ime ka a mụọ ya?”ka Onyenwe anyị na-ekwu.“M ga-emechi akpanwamgbe m na-eme ka a mụpụta ya?”ka Chineke gị jụrụ.10“Soronụ Jerusalem ṅụrịa ọṅụ, soronụ ya nwee obi ụtọ,unu ndị niile hụrụ ya nʼanya;soronụ ya ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu,unu ndị ruru ụjụ nʼihi ya.11Nʼihi na ihe banyere Jerusalem ga-atọ unu ụtọ.Unu ga-aṅụjukwa ara nkasiobi ya afọ,ọ bụladị dịka nwantakịrị si enwe obi ụtọmgbe ọ na-aṅụ ara nne ya nke na-agba nke ọma.”12Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru,“Aga m eme ka udo bara ya ụba dịka osimiri,mee ka akụnụba niile nke ndị mba ọzọ dịrị ka mmiri na-asọbiga oke.Ọ ga-elekọta gị, kurukwa gị, makụọkwa gị nʼaka ya,wugharịakwa gị nʼikpere ya.13Dịka nne si akasị nwa ya obi,otu a ka m ga-esi kasịe unu obi.Ọ bụ nʼime Jerusalem ka a ga-akasị unu obi.”14Mgbe ị hụrụ ihe ndị a, obi gị ga-aṅụrị ọṅụ,ịga awasa dịka ahịhịa ọhụrụ;a ga-emekwa ka aka Onyenwe anyị pụta ìhè nʼebe ndị ohu ya nọ,ma a ga-egosi ndị iro ya oke iwe ya.15Nʼihi na lee, Onyenwe anyị ga-eji ọkụ bịa.Ụgbọala ya ga-adịkwa ka oke ifufe.Ọ ga-eji ọnụma gosi iwe ya,werekwa ọkụ na-enwu enwu baa mba.16Nʼihi na Onyenwe anyị ga-eji ọkụ na mma agha yakpee ndị mmadụ niile ikpe.Ọ ga-egbukwa ọtụtụ mmadụ.17“Ndị ahụ niile na-edo onwe ha nsọ, ndị na-eme onwe ha ka ha dị ọcha nʼihi ịbanye nʼubi a gbara ogige, ndị ahụ na-eso onye ahụ nọ nʼetiti ndị ahụ na-eri anụ ezi, na oke, na ihe ndị ọzọ ahụ niile rụrụ arụ, ga-ezute ọnwụ nke nọ na-eche ha niile.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.18“Ma mụ onwe m, amaara m nke ọma ihe ha zubere ma meekwa, ana m abịa ịchịkọta mba niile na-asụ asụsụ dị iche iche. Ha niile ga-abịakwa hụ ebube m.19“Aga m edokwa ihe ịrịbama nʼetiti ha, zipụkwa ndị fọdụrụ ndụ nʼetiti ha ka ha gaa nʼobodo Tashish, na Libiya,na Lidiya(ndị na-agba àkụ nʼụta nke ọma) na Tubal, na Griis. E, ha ga-eje na mba niile nke dị anya, nʼofe osimiri, ebe ndị bi nʼime ya na-anụbeghị ihe banyere ịdị ukwuu nke m, maọbụ hụ ebube m. Ha ga-ekwusakwa ihe banyere ebube m nʼetiti mba niile dị iche iche.20Ha ga-akpọghachi ụmụnne unu niile site na mba niile, bịa nʼugwu nsọ m dị na Jerusalem, dịka onyinye a na-ewetara Onyenwe anyị. Ha ga-ebute ha nʼelu ịnyịnya, nʼụgbọ agha, nʼelu ụgbọala a na-adọkpụ adọkpụ, nʼelu ịnyịnya muul na nʼelu ịnyịnya kamel,” ka Onyenwe anyị na-ekwu. “Ha ga-ebubata ha dịka mgbe ndị Izrel na-ewebata onyinye mkpụrụ ha nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼefere mmemme dị ọcha.21Aga m ahọrọkwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị nchụaja na ndị Livayị,” ka Onyenwe anyị kwuru.22“Dịka eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ ahụ nke m ga-eke ga-esi dịgide nʼihu m, otu a ka aha unu na agbụrụ unu ga-adịgide, ka Onyenwe anyị kwubiri.23Ọ ga-abụkwa na site nʼotu Ọnwa ọhụrụ ruo nke ọzọ, sitekwa nʼotu ụbọchị izuike ruo na nke ọzọ ya, anụ ahụ niile bụ mmadụ ga-abịa, daa, kpọọ isiala nʼihu m,” ka Onyenwe anyị kwuru.24“Ha ga-apụ, jee, lekwasị ozu ndị ahụ niile nwụrụ anwụ anya, bụ ndị ahụ niile nupuru isi megide m. Nʼihi na ikpuru ha agaghị anwụ anwụ, ọkụ a kwanyere agakwaghị anyụ anyụ. Ha ga-abụkwara mmadụ niile ihe na-asọ oyi.”