1“Ana m egosipụta onwe m nye ndị ahụ na-adịghị ajụ ase m.Ọ bụkwa ndị ahụ na-adịghị achọsi m ike na-achọta m.Ana m agwa mba ahụ nke na-adịghị akpọku aha m,asịrị m, ‘Lee m, anọ m nʼebe a.’2Ogologo ụbọchị niile ka m gbasapụrụ aka m abụọnye ndị na-enupu isi,bụ ndị na-agbaso ụzọ na-ezighị ezindị a na-agbaso ihe ọbụla ha tụpụtara nʼuche ha,3ndị na-anọgide na-akpasu m iwenʼihu m mgbe niile,ndị na-achụ aja nʼubi ha a gbara ogige,nʼebe ịchụ aja eji brik wuo,4ndị na-anọdụ nʼetiti ili,ma na-anọdụkwa ọnọdụ abalị nʼebe nzuzo dị iche iche;ndị na-eri anụ ezi,ndị ite ofe ha jupụtara nʼanụ na-adịghị ọcha;5ndị na-asịrịta onwe ha, ‘Nọdụ iche, Abịala m nso,nʼihi na ị ga-emerụ m, adị m nsọ karịa gị!’Ma ndị dị otu a dịka anwụrụ ọkụ nʼimi m.Ha bụ ọkụ na-enwu ehihie na nʼabalị.6“Lee, edeela ya rịị nʼihu m sị:Agaghị m agba nkịtị, aga m akwụghachi nʼuju.E, aga m akwụghachi ha.7Ọ bụghị naanị maka mmehie ha, kama maka mmehie nna nna ha niile,”Otu a ka Onyenwe anyị kwuru,“Nʼihi na ha surere aja nsure ọkụ nʼelu ugwu dị iche iche,kparịakwa m nʼelu ugwu nta niile.Aga m akwụghachi ha nʼuju,nʼihi ihe ndị a niile ha mere nʼoge gara aga.”8Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,“Dịka a na-achọta mmanya site nʼụyọkọ mkpụrụ vaịnịndị mmadụ asị, ‘Ebibila ya,nʼihi na ngọzị ka dị nʼime ha,’otu a ka m ga-eme nʼihi ndị ohu m;Agaghị m ebibicha ha niile.9Aga m eme ka mkpụrụ site na Jekọb pụta,sitekwa na Juda nweta ndị ga-enweta ugwu m niile.Ndị m họpụtara ga-eketa ha,ndị ohu m ga-ebikwa nʼebe ahụ.10Sharọn ga-aghọkwa ebe ịta nri nke igwe anụ ụlọ;Ndagwurugwu Akọ ga-abụkwa ebe izuike nye igwe ehi,na ndị m na-achọsi m ike.11“Ma unu ndị wezugara onwe unu site nʼebe Onyenwe anyị nọ,ndị chezọrọ ugwu nsọ m,ndị na-edozi tebul maka Ihuọma,ndị na-agbaju mmanya agwara ọgwa nʼiko maka Akara aka.12Aga m eme ka unu zute mma agha;unu niile ga-adakwa mgbe a na-egbu unu.Nʼihi na akpọrọ m unu ma unu azaghị;mgbe m gwara unu okwu, unu aṅaghị ntị.Unu kpachapụrụ anya mehie megide m nʼihu,họrọkwa ime ihe ndị ahụ unu maara nke ọma na m kpọrọ asị.”13Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu,“Ndị ohu m ga-eriju afọ,ma unu ga-anọ agụụ,akpịrị ga-akpọkwa unu nkụ,ma ha ga-aṅụ mmiri.Unu ga-anọ nʼọnụma na ihere,ma ha ga-anọ nʼọṅụ.14Ndị ohu m ga-abụ abụnʼihi ọṅụ nke jupụtara nʼobi ha,ma unu ga-akwa akwa,nʼihi ihe mgbu nke obi unu,tiekwa mkpu akwa nʼihi obi ntiwa nke mmụọ unu.15Unu ga-ahapụ aha ununye ndị m họpụtara nye onwe m ka ọ bụrụ ihe ha ji abụ ọnụ;nʼihi na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị ga-etigbu unu,ma ọ ga-akpọ ndị ohu ya aha ọzọ.16Onye ọbụla na-ekpe ekpere nʼala ahụ,ga-eme otu a nʼaha Chineke nke eziokwu,onye ọbụla na-aṅụkwa iyi nʼime ala ahụga-aṅụ iyi nʼaha Chineke nke eziokwu.Nʼihi na-echezolam nsogbu niile ndị gara aga,zokwa ha site nʼanya m.
Ụwa ọhụrụ na eluigwe ọhụrụ
17“Nʼihi na lee, ana m ekeeluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.Ọ dịghị onye ga-echetakwa ndị ochie ahụ ọzọ;ọ gaghị abatakwa nʼechiche onye ọbụla.18Ma ṅụrịanụ ọṅụ, tegharịakwa mgbe niile nʼobi ụtọnʼihi ihe nke mụ onwe m na-eke,nʼihi na-aga eke Jerusalem ka ọ bụrụ ihe ọṅụndị ya ga-abụkwa ihe obi ụtọ.19Aga m aṅụrị ọṅụ nʼihi Jerusalem,nweekwa obi ụtọ nʼihi ndị m;a gaghị anụkwa olu ịkwa akwa nʼime ya ọzọ,maọbụ olu iti mkpu akwa.20“Ọ dịghịkwa nwa ọhụrụ nwụchuru anwụchuga-adị nʼebe ahụ ọzọ,a gaghị ahụkwa agadi nwoke nke na-anọzughị ụbọchị ndụ ya;nʼihi na a ga-agụnye onye nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ tupu ọ nwụọdị ka nwantakịrị;a ga-agụkwa onye na-anọrughị narị afọdịka onye a bụrụ ọnụ.21Ha ga-ewu ụlọ, biekwa nʼime ya;ha ga-akụkwa ubi vaịnị, riekwa mkpụrụ ha.22Ndị m agaghị ewukwa ụlọ hapụrụ ya ndị ọzọ,maọbụ ghaa mkpụrụ nʼubi nke ndị ọzọ ga-aghọrọ rie.Nʼihi na dịka osisi si adị ndụ ogologo ogeotu a ka ndị m ga-esi dịkwa ndụ ogologo oge.Ha ga-aṅụrịkwa ọṅụnʼihe ahụ ha ji aka ha rụpụta.23Ha agaghị adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu.Ha agaghị amụtakwa ụmụ ndị ga-emesịa nwụchuo ọnwụ.Nʼihi na ha ga-abụ ndị Onyenwe anyị gọziri,ha na ụmụ ụmụ ha.24Tupu ha akpọkuo m, aga m aza ha.Mgbe ha ka nọ na-agwa m banyere mkpa ha, aga m anụ, zakwa ekpere ha.25Nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-atakọ nri nʼotu ebe,ọdụm ga-ata ahịhịa dịka ehi,ma agwọ ọjọọ niile ga-ata aja!Ha agaghị emerụ ihe ọbụla ahụ,maọbụ bibie ihe ọbụla nʼugwu nsọ m.”Ka Onyenwe anyị kwuru.