Aịzaya64ibo_bib
1Ọ gaara adị mma ma asị na ị ga-adọwa eluigwe rịdata nʼala,ma asị nʼugwu ukwu niile ga-ama jijiji nʼihu gị!2Dịka mgbe ọkụ na-agba ụmụ osisi,na-eme ka mmiri e sikwasịrị nʼọkụ gbọọ.Si nʼelu rịdata bịa mee ka ndị iro gị niile maara aha gị,meekwa ka mba niile dị iche iche maa jijiji nʼihu gị.3Nʼihi na ọ bụ mgbe i mere ọtụtụ ihe egwu dị iche iche nke anyị na-atụghị anya yaka ị rịdatara mee ka ugwu ukwu niile maa jijiji nʼihu gị.4Nʼihi na site na mgbe ochie, ọ dịbeghị onye nụrụ,ọ dịbeghị ntị ghọtara,o nwebeghị anya hụrụ Chineke ọzọ karịa gị,onye na-emejupụtara ndị na-echere ya ihe na-akpa ha.5Ị na-enyere ndị na-eme ezi ihe aka,bụ ndị ji ọṅụ na-echeta ụzọ gị nʼechiche uche ha.Ma mgbe anyị nọgidere na-emehie megide ha,iwe were gị.A ga-esikwanụ aṅaa zọpụta anyị?6Anyị niile dịka onye rụrụ arụ,ezi omume anyị niile kwa dịka nkịrịnka akwa ruru unyi.Anyị akpọnwụọla dịka akwụkwọ osisi,mmehie anyị na-ebufukwa anyị dịka ifufe.7Ọ dịghị onye nʼime anyị na-arịọ gị arịrịọ;ọ dịkwaghị onye na-akpọku aha gị.Nʼihi ya, i zoola ihu gị site nʼebe anyị nọ,meekwa ka anyị bụrụ ndị gbazere agbaze nʼihi mmehie anyị.8Ma otu ọbụla o si dị, gị Onyenwe anyị bụ Nna anyị.Anyị bụ ụrọ, ma ị bụ ọkpụ ite.Ọ bụ aka gị kpụrụ anyị niile.9Biko, Onyenwe anyị, anọgidela na-eweso anyị iwe;echetakwala mmehie anyị ọzọ ruo mgbe ebighị ebi.Biko, lekwasị anyị anyanʼihi na ndị gị ka anyị bụ.10Obodo nsọ gị niile aghọọla ọzara;ọ bụladị Zayọn aghọọla ọzara, Jerusalem, ebe tọgbọrọ nʼefu.11Ụlọnsọ ukwu anyị ahụ mara mma, nke dịkwa nsọ, ebe nna anyị ha nọ too gị, ma feekwa gị ofufe,abụrụla ihe a gbara ọkụ.Ihe niile mara mma nʼime ya alaala nʼiyi.12Mgbe ihe niile gasịrị, Onyenwe anyị, ị ga-ejisi onwe gị ike?Ị ga-agba nkịtị, taa anyị ahụhụ ebe ọ gafere oke?