1“Welie olu gị tie mkpu, egbochikwala iti mkpu.Welie olu gị dịka opi ike.Gwa ndị m nnupu isi ha,gwakwa ụlọ Jekọb mmehie ha.2Kwa ụbọchị ka ha na-achọ mha na-eme dịka ọ na-agụ ha agụ ịmara ụzọ m niile,dịka a ga-asị na ha bụ mba na-eme ihe ziri ezi,ndị na-agbakụtaghị iwu Chineke ha azụ.Ha na-ajụ m maka ikpe ziri ezi,na-eme dịka ọ na-agụ ha agụụ ka Chineke bịaruo ha nso.3Ha na-asị, ‘Nʼihi gịnị ka anyị ji ebu ọnụ,ma ị dịghị ahụta ya?Nʼihi gịnị ka anyị ji weda onwe anyị nʼala,ma ị dịghị ahụta nke a?’“Ma nʼụbọchị unu na-ebu ọnụ, unu na-eme ihe masịrị unu,unu na-eji anya ike nara ndị na-arụrụ unu ọrụ ihe ha rụpụtara.4Nʼoge ahụ, ọ bụ ise okwu na ịlụ ọgụ,ya na iti ibe unu ọkpọ nʼihi ajọọ obi ka unu ji emechi ụbọchị ibu ọnụ unu.Unu apụghị ibu ọnụ otu unu si eme taana-ele anya ka anụ olu unu nʼelu.5Nke a ọ bụ ụdị obubu ọnụ nke m họpụtara,naanị ụbọchị nke ndị mmadụ ji eweda onwe ha nʼala?Ọ bụ naanị nke mmadụ ji ehulata isi ya nʼala dịka osisi achara,nke i dina nʼakwa mkpe na ntụ?Ọ bụ nke a ka unu na-akpọ obubu ọnụ,ụbọchị nke Onyenwe anyị nabatara?6“Nke a ọ bụghị ụdị obubu ọnụ m họpụtara:Ịtọpụ agbụ niile nke ikpe na-ezighị ezi,na ịtọpụ ụdọ niile nke mmegbu,na ime ka ndị a na-emegbu nwere onwe hana itiji yoku ọbụla?7Ka i kenye ndị agụụ na-agụ ihe oriri gị,ka ị kpọbata nʼime ụlọ gị ndị na-enweghị onye inyeaka, ma ndị ogbenye.Ka i nye ndị na-agba ọtọ uwe,ka ị hapụ izo onwe gị nʼebe ndị ikwu gị chọrọ inyeaka gị nọ.8Ọ bụrụ na i mee ihe ndị a, aga m eme ka ihuọma m chakwasị gị dịka ìhè isi ụtụtụ.A ga-agwọkwa ọrịa gị niile.Mgbe ahụ, ezi omume gị ga-edu gị,ebube Onyenwe anyị ga-echekwa gị nʼazụ.9Mgbe ahụ, ị ga-akpọ, Onyenwe anyị ga-azakwa,ị ga-eti mkpu akwa maka enyemaka, ọ ga-asị gị, Lekwa m nʼebe a.“Ọ bụrụ na ị wezuga yoku mmegbu,ọ bụrụkwa na ịkwụsị ịtụ mkpịsịaka, na ịgbasa okwu ịkpọ asị,10ọ bụrụ na inye ndị agụụ na-agụ nri,nyere ndị nọ na mkpa aka,mgbe ahụ, ìhè gị ga-achawapụta,ọchịchịrị niile gbara gị gburugburu ga-aghọ ìhè, na-achakwa ka ehihie.11Onyenwe anyị ga na-edu gị mgbe niile.Ọ ga-eme ka afọ jụ gị nʼala kpọrọ nkụ,meekwa ka ị nọrọ nʼahụ isiike.Ị ga-adịkwa ka ubi a gbara ogige nke a na-agba mmiri nke ọma,dịka isi iyi na-adịghị ata ata.12Ndị gị ga-edozi mkpọmkpọ ebe ochie niile.Ha ga-ebulikwa ntọala nke mgbe ochie.A ga-akpọ unu ndị na-edozi mgbidi dara ada,ndị na-arụzikwa okporoụzọ nke ebe obibi.13“Ọ bụrụ na i debe ụkwụ gị site na-edebeghị ụbọchị izuike nsọ,sitekwa na-ime ihe ndị na-atọ gị ụtọ nʼụbọchị nsọ m,ọ bụrụ na ịkpọ ụbọchị izuike m ihe mmasịna ụbọchị nsọ Onyenwe anyị ihe a na-akwanyere ugwu,ọ bụrụ na ị sọpụrụ ya site na-emeghị ihe nʼụzọ nke gị,na-emeghị ọchịchọ nke obi gị, maọbụ ikwugheri ọnụ,14mgbe ahụ, ị ga-achọta ọṅụ gị nʼime Onyenwe anyị,m ga-emekwa ka ịnọkwasị nʼebe dị elu niile nke ala ahụ,meekwa ka irie oriri na ihe nketa nke nna gị Jekọb.”Nʼihi na ọnụ Onyenwe anyị ekwuola ya.