Aịzaya55ibo_bib

Bịanụ ndị akpịrị na-akpọ nkụ

1Gee ntị, bịa onye ọbụla akpịrị na-akpọ nkụ,bịanụ na mmiri,unu ndị na-enweghị egobịanụ zụọ, riekwa.Bịanụ, zuru mmanya na mmiri ara ehina-ejighị ego na-arụghị ọnụahịa ọbụla.2Nʼihi gịnị ka i ji na-atụfu ego gị ịzụ ihe na-abụghị ezi nri?Gịnị mere i ji na-adọgbu onwe gị nʼọrụ nʼihe na-apụghị iju gị afọ?Gee ntị, geenụ m ntị nke ọma, rie ezigbo nrimkpụrụobi gị ga-enwe afọ ojuju na nri dị ezi mma!3“Tọọnụ ntị unu nʼala, bịakwute m!Gee ntị, ka inwe ike dị ndụ.Mụ na unu ga-aba nʼọgbụgba ndụ ebighị ebi,bụ ịhụnanya m kwesiri ntụkwasị obi nke m kwere Devid na nkwa.4Lee, emere m ya ka ọ ghọọrọ ndị niile dị iche iche onyeama,ka ọ bụrụ onyendu na onyeisi ọchịchị nye ndị niile dị iche iche.5Nʼezie, gị onwe gị ga-akpọku mba dị iche iche na i maghị,mba ndị ahụ na-amaghị gị ga-ejikwa ọsọ gbakwute gị,nʼihi Onyenwe anyị Chineke gị,Onye nsọ nke Izrel,nʼihi na o meela ka ị bụrụ ihe dị oke mma.”
6Chọọnụ Onyenwe anyị mgbe a ga-achọta ya.Kpọkuonụ ya mgbe ọ nọ nso.7Ka onye na-eme ihe ọjọọ hapụ ụzọ ya,ka onye ajọ omume hapụ echiche ọjọọ ya niile.Ka ha tụgharịa bịakwute Onyenwe anyị, ọ ga-emere ha ebere,ha bịakwute Chineke anyị, nʼihi na ọ ga-agbaghara ha mmehie ha niile.
8“Nʼihi na echiche m ha abụghị echiche unu,ụzọ unu niile, ha abụkwaghị ụzọ m,”ka Onyenwe anyị kwupụtara.9“Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa,otu a ka ụzọ m niile si dị elu karịa ụzọ unu niile,otu a kwa ka echiche m niile si dị elu karịa echiche unu niile.10Dịka mmiri na mkpụrụ mmirisi esi nʼeluigwe ada nʼụwana-alaghachighị nʼeluigwema ọ bụrụ na o meghị ka mmiri dee ala,mee ka ihe ubi pupụta, too eto,meekwa ka ọ mịa mkpụrụ nye onye na-akụ ihe ọkụkụ, bụrụkwa ihe oriri nye onye na-eri nri.11Otu a ka okwu si m nʼọnụ pụọ si adị.Ana m ezipu ya, ọ gaghị alọghachikwute m nʼefu.Ọ ga-emezu ihe niile m chọrọ ka o mee,baakwa ụba ebe ọbụla m zigara ya.12Nʼihi na unu ga-eji ọṅụ pụọ,a ga-esikwa nʼebe ahụ dupụta unu nʼudo.Ugwu ukwu niile, na ugwu nta niilena osisi niile nke ubi,ga-eti mkpu ọṅụ,kụọkwa aka nʼobi ụtọ.13Ebe ogwu na-eto na mbụ, osisi junipa ga-eto na ya;ebe uke toro, osisi mietul ga-eto na ya.Ihe ndị a ga-aghọrọ Onyenwe anyị aha dị ukwuu,nke ga-abụkwa ihe ịrịbamaga-adị ruo mgbe ebighị ebi.”