1“Bụọ abụ, gị nwanyị aga,gị onye na-amụtaghị nwa;tie mkpu ọṅụ, tiwakwaa olu abụ,gị onye ime nwa na-emetụbeghị;nʼihi na ụmụ nwanyị ahụ a hapụrụ naanị ya ga-adị ọtụtụkarịa ụmụ nke nwanyị nwere di,”Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.2“Mee ka ebe ụlọ ikwu gị saa mbara,gbasapụ akwa mgbochi ụlọ ikwu gị,egbochila gbasapụ aka;mee ka ụdọ gị dị ogologo,meekwa ka o sie ike nke ọma.3Nʼihi na nʼaka nri na nʼaka ekpe ka ị ga-agbasa gaa;ụmụ gị ga-achụpụ mba dị iche iche site nʼala ha,bichikwaa nʼobodo ha niile dakpọsịrị adakpọsị, nke tọgbọrọ nʼefu.4“Atụla egwu, nʼihi na ihere agaghị emekwa gị ọzọ.Ị gaghị abụkwa onye e wedara nʼala.Ị gakwaghị echeta ihere mere gị mgbe ị bụ nwantakịrị,na ịta ụta dịrị gị nʼihi ọnwụ di gị.5Nʼihi na onye kere gị ga-abụrụ gị di.Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile;Onye nsọ Izrel bụ Onye mgbapụta gị,Chineke nke ụwa niile ka a na-akpọ ya.6Nʼihi na Onyenwe anyị ga-akpọghachi gịdịka a ga-asị na ị bụ nwunye a hapụrụ ahapụ, nke ọ na-ewutakwa nʼime mmụọ yabụ nwunye alụtara na nwantakịrị,naanị ka ọ bụrụ onye ajụrụ ajụ,” ka Chineke gị na-ekwu.7“Naanị nwa mgbe nta ka m hapụrụ gị.Ma aga m eji obi ebere ukwuu kpọghachikwa gị8Na nwa oge, esitere m nʼoke iwe na-ewe mzonarị gị ihu m,ma site nʼịhụnanya m nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,aga m enwe ọmịiko nʼahụ gị.”Otu a ka Onyenwe anyị, onye mgbapụta gị kwuru.9“Dịka m si ṅụọ iyi nʼoge Noa sị na m agaghị ekwekwa ka mmiri kpuchie ụwa ọzọ,bibie ndụ ndị dị nʼime ya,ana m aṅụkwa iyi ugbu a na mụ agaghị ekwe ka iwe m bịakwasị gị ọzọ.Agakwaghị m abasiri gị mba ike.10Nʼihi na a pụrụ iwezuga ugwu ukwu niile,wezugakwa ugwu nta niile site nʼọnọdụ ha,ma obi ebere m agaghị esi nʼebe ị nọ pụọ,agaghị ewezugakwa ọgbụgba ndụ nke udo m,”ka Onyenwe anyị, onye nwere ọmịiko nʼahụ gị, kwuru.11“Gị, onye a na-emekpa ahụ, onye oke ikuku ụwa a na-ebugharị, nke onye ọbụla na-adịghị akasị obi,lee, aga m e ji nkume tọkwọisi wugharịa gị,jirikwa nkume ọma safaia dị oke ọnụahịa tọọ ntọala gị niile.12Aga m eji nkume rubi wugharịa akụkụ ụlọ gị niile,jiri nkume na-egbu nweghenweghe wuo ọnụ ụzọ ama gị niile.Aga m ejikwa nkume dị oke ọnụahịa wuo mgbidi obodo gị.13Ụmụ gị niile ga-abụ ndị Onyenwe anyị ga-akụziri ihe.Udo ha ga-adịkwa ukwu.14Nʼezi omume ka a ga-eme ka ị guzosie ike.Mmegbu ga-adịkwa anya site nʼebe ị nọ,nʼihi ya, ị gaghị atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla.Ọ dịghị ihe egwu ga-abịaru gị nso,nʼihi na a ga-ewezuga ha site nʼebe ị nọ.15Ọ bụrụ na onye ọbụla abịa ịlụso gị ọgụ, ọ siteghị nʼaka m;onye ọbụla nke na-alụso gị ọgụ ga-abụ onye e meriri emeri.16“Lee, ọ bụ mụ onwe m kere ọkpụ ụzụnke na-eji icheku afụ ọkụo ji akpụ ihe agha nke mbibi.Ọ bụkwa m kere ndị agha ahụ mbibi bụ ọrụ ha.17Nʼụbọchị ahụ, ọ dịghị ihe agha a kpụrụ megide gị nke ga-adị ire.Ọzọ, ị ga-emeri ndị niile kpọrọ gị ikpe mmegide.Nʼihi na nke a bụ ihe nketa dịrị ndị ohu Onyenwe anyị.Mkpepụta ha na-esite na m.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.