Aịzaya52ibo_bib

1Teta, teta gị Zayọn,yikwasị onwe gị ike dịka uwe!Yikwasị onwe gị uwe mara mma,gị Jerusalem, obodo dị nsọ.Ndị a na-ebighị ugwu na ndị rụrụ arụagaghị abata nʼime gị ọzọ.2Kụchapụ aja dị nʼahụ gị,bilie ọtọ, gị Jerusalem, nọdụ ala nʼocheeze gị.Tọpụ onwe gị site nʼagbụ igwe e kere gị nʼolu,gị ada Zayọn, a dọtara nʼagha.3Nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị sịrị,“Nʼefu ka erere unu, anaghị ndị zụrụ unu ego ọbụla,ọ bụghịkwa ego ka a ga-eji gbapụta unu.”4Nʼihi na otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,“Na mbụ, ọ bụ nʼala Ijipt ka ndị m gara biri,ugbu a, ọ bụ ndị Asịrịa na-akpagbu ha.5“Ma ugbu a, gịnị ka m nwere nʼebe a?” bụ ihe Onyenwe anyị kwupụtara.“Ebe ọ bụ na e durula ndị m pụọ nʼefu,ndị na-achị ha na-akwakwa ha emo na-achị ha ọchị nlelị,”ka Onyenwe anyị kwupụtara.“Ha na-ekwulukwa aha mogologo ụbọchị niile.6Nʼihi ya, ndị m ga-ama aha m;nʼihi nke a, ha ga-amarakwa nʼụbọchị ahụna ọ bụ Mụ onwe m kwuru na ọ ga-eme.E, ọ bụ mụ onwe m.”
7Lee ka ha si maa mma nʼelu ugwubụ ụkwụ ndị na-eweta oziọma,onye na-ekwusa okwu udo,e, onye na-eweta akụkọ ọma,onye na-agbasa akụkọ banyere nzọpụta,onye na-asị Zayọn,“Lee, Chineke gị bụ eze!”8Geenụ ntị! Nụrụnụ olu ndị nche unu,ndị na-eweli olu ha elu na-eti mkpu ọṅụ.Nʼihi na mgbe Onyenwe anyị ga-alọghachi Zayọn,ha ga-ahụ ya anya.9Tienụ mkpu ọṅụunu mkpọmkpọ ebe niile e tikpọrọ etikpọ na Jerusalem,nʼihi na Onyenwe anyị akasịela ndị ya obi.Ọ gbapụtala Jerusalem.10Onyenwe anyị ga-emeka mba niile hụrụ ike ya dị nsọ;ebe niile ụwa sọtụrụ ga-ahụkwanzọpụta Chineke anyị.
11Wezuganụ onwe unu, wezuganụ onwe unu, sinụ nʼebe ahụ pụọ.Unu emetụkwala ihe ọbụla rụrụ arụ aka.Sitenụ nʼetiti ya pụta, dịrịnụ ọcha,unu ndị na-ebu ihe dị iche iche nke ụlọ Onyenwe anyị.12Ma unu agaghị eji ọkụ ọkụ pụọ,unu agakwaghị agbapụ ọsọ,nʼihi na Onyenwe anyị ga-ebutere unu ụzọ,ọ bụkwa ya, Chineke Izrel, ga-echebe unu nʼazụ.

Ahụhụ na Ebube nke ohu ahụ

13Lee, ohu m ga-enwe uche,a ga-ebulikwa ya elu, ọ ga-abụkwa onye a na-asọpụrụ.14Dịka ibubo si nwụọ ọtụtụ ndị mmadụ nʼahụ;otu a ka ihu ya bụ ihe e bibiri ebibi nke ukwuu, nke mere na ọ dịkwaghị ka ihu mmadụ ọzọ,anụ ahụ ya ka ebibikwara nʼụzọ ọ na-agaghị eyikwa anụ ahụ mmadụ.15Otu a ka ọ ga-esi fesaa ọtụtụ mba dị iche iche,ndị eze ga-emechikwa ọnụ ha nʼihi ya,ọ bụ ihe a na-agwaghị ha ka ha ga-ahụ,ihe ha a ka anụbeghị, ka ha ga-aghọtakwa.