Aịzaya50ibo_bib

Mmehie Izrel na nrube isi nke ohu ahụ

1Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,“Olee ebe akwụkwọ m ji gbaa nne unu alụkwaghị m dịbụ nke m ji chụpụ ya?Ma ọ bụ onye nʼime ndị m ji ụgwọka m resiri unu?Ọ bụ nʼihi mmehie unu ka e ji ree unu;nʼihi mmebi iwu unu ka e jiri chụọ nne unu.2Gịnị mere o ji bụrụ na o nweghị onye nọ ya mgbe m bịara?Gịnị mere o nweghị onye zara m mgbe m kpọrọ oku?Ọ pụtara na aka m dị mkpụmkpụ ịzọpụta unu?Ọ ga-abụ na m enwekwaghị ike ịzọpụta?Nʼihi na enwere m ike ịbara osimiri mba mee ya ka ọ ghọọ ala akọrọ.Enwere m ike ime ka osimiri ghọrọ ọzara,ka azụ niile dị nʼime ya nwụọnʼihi enweghị mmiri.3Ọ bụ mụ bụ onye ahụ na-eme ka ọchịchịrị kpuchie ihu eluigwe,ka ihu eluigwe dịrị ka ihu onye na-eru ụjụ.”
4Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị enyela m amamihe yaka m nwee ike ịmata ihe m ga-agwa ndị a ike gwụrụ.Ụtụtụ niile ka ọ na-akpọte mmụọ m,meghee akpa uche m, ime ka m ghọta uche ya.5Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị emeghela ntị m abụọ,ma enupughị m isi,a tụgharịkwaghị m azụ.6Azụ m ka m megheere ndị tiri m ihe;agba nti m abụọ ka m hapụụrụ ndị hopusiri m afụọnụ m.Ezopụghị m ihu mnʼebe ndị na-akwa emo, na ndị na-agbụ ọnụ mmiri nọ.7Ebe ọ bụ na Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-enyere m aka,ihere agaghị eme m.Nʼihi ya, ejikerela m onwe m ime uche ya; agaghị m elekwa anya nʼazụ,a maara m na ihere agaghị eme m.8Nʼihi na onye na-agụ m nʼonye ezi omume nọ nso.Onye ga-apụta ibo m ebubo?Ya pụta ka anyị guzo ihu na ihu!Onye nwere ebubo megide m?Ya bịa ka anyị kwuo ya.9Lee, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị bụ onye na-enyere m aka.Onye pụrụ ịma m ikpe?Lee, ha niile ga-aka nka dịrị ka uwe,nla ga-erichapụkwa ha.
10Onye nʼetiti unu bụ onye ahụ na-atụ egwu Onyenwe anyị,na-egekwa ntị nʼokwu odibo ya?Ka onye ahụ na-eje ije nʼọchịchịrị,nke na-enweghị ìhè ọbụla,tụkwasị obi nʼaha Onyenwe anyịdaberekwa na Chineke ha.11Ma lee, unu niile ndị na-amụnye ọkụ,ndị meere onwe ha ọwaọkụ,nke unu ji na-ejegharị nʼọchịchịrị,gaanụ nʼihu na-ejegharị nʼìhè ọkụ ahụ unu mụnyeere onwe unu.Ihe unu ga-anata site nʼaka Onyenwe anyịbụ ihe mwute nke ga-abịakwasị unu.