1“Rịda nʼala, nọdụ na uzuzu,gị nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, bụ ada Babilọn,nọdụ nʼala na-ejighị ocheeze,gị eze nwanyị obodo ndị Babilọn.Agaghị akpọkwa gịonye dị nro, maọbụ onye dị pekepeke.2Were nkume igwe nri gwee ọka,wepụ akwa ahụ i ji kpuchie ihu gị.Chilite uwe mwụda gị, kpughepụ ogwe ụkwụ gị,mgbe ị na-agabiga iyi dị iche iche.3A ga-ekpughe ọtọ gị,tinyekwa gị nʼọnọdụ ihere.Nʼihi na aga m abọtara ndị m ọbọ,agaghị m elekwa anya nʼazụ.”4Otu a ka Onye mgbapụta anyị kwuru, Onye ga-azọpụta Izrel. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,Onye nsọ Izrel.5“Nọdụ duu, baa nʼime ọchịchịrị,gị eze obodo nke ndị Kaldịa;Ọ dịkwaghị mgbe ọzọ a ga-akpọ gịnwanyị nwe alaeze dị iche iche.6Ewesoro m ndị m iwe,mee ndị ahụ bụ ihe nketa m ka ha ghọọ ihe na-adịghị nsọ.Eweere m ha tinye gị nʼaka,ma i gosighị ha obi ebere.Ọ bụladị ndị bụ agadi nʼetiti haka ị bokwasịrị ibu arọ.7I kwuru sị,‘Abụ m eze nwanyị ruo mgbe ebighị ebi!’Ma i cheghị echiche banyere ihe ndị a,ị tụgharịghị uche banyere ihe pụrụ ime.8“Ugbu a gee ntị, gị onye na-eme dịka o si tọọ gị ụtọ.Gee ntị, gị onye na-anọ nʼudo,na-asị onwe gị,‘Ọ bụ naanị m dị, o nweghị onye ọzọ ka m nʼụwa.O nweghị mgbe m ga-adị ka nwanyị di ya nwụrụ,maọbụ dịka nwanyị ụmụ ya nwụrụ.’9Ma lee anya!Ihe abụọ ndị a na-aga ịbịakwasị gịna mberede.Nʼotu ụbọchị di gị ga-anwụ, ụmụ gị ga-anwụchakwa.Mgbaasị gị niile, na ịdị ike nke ọgwụ okike gị niile,agaghị egbochi ihe ndị a ịbịakwasị gị nʼuju.10Nʼihi na i werela obi gị tụkwasị nʼajọ omume gịị na-asị, ‘O nweghị onye na-ahụ m.’Ma amamihe gị na ihe ọmụma gị na-eduhie gị,mgbe ị na-asị onwe gị,‘Ọ bụ naanị mụ onwe m, ọ dịghịkwa onye ọzọ ma ewezuga m.’11Ihe ọjọọ ga-abịakwasị gị,ị gaghị ama otu ị ga-esi gbaa afa iwezuga ya.Oke mbibi ga-adakwasị gịnke ị na-agaghị enwe ike iji ego gbara onwe gị;Ịla nʼiyi nke ị na-atụghị anya yaga-abịakwasị gị na mberede.12“Dokọtazie ọgwụ okike gị niile,na ihe mgbaasị gị niile.Ihe ndị ahụ niile i jirila na-eche onwe gị siterị na mgbe ị bụ nwantakịrị.Ma eleghị anya ha pụrụ inyere gị aka nʼoge dị nʼihu.Ị pụrụ iji ha menye ndị iro gị ụjọ, maọbụ mee ka ha maa jijiji.13Ndụmọdụ niile a na-enye gị adịghị enyere gị aka.Mee ka ndị ahụ ihe banyere ngagharị ọnwa na kpakpando doro anya bịa nso.Kpọpụta ndị ahụ na-esite nʼihe ha hụrụ na kpakpando akọwa ihe ga-eme site nʼotu ọnwa ruo nʼọnwa nke ọzọ.Kpọkuo ha ka ha zọpụta gị site na nsogbu nke na-aga ịbịakwasị gị.14Lee, ha bụ ihe efu dịka ahịhịa kpọrọ nkụ.Ọkụ ga-erechapụkwa ha.Ha apụghịkwa ịzọpụta onwe hasite nʼọkụ ahụ na-enwusi ike.Nʼihi na ọkụ ahụ adịghị ka ọkụ a na-akwanye,nke a na-anya nʼoge oyi.15Lee ihe ndị a na-enyocha kpakpando ga-emere gị,bụ ndị ị na-aṅa ntị na ndụmọdụ hasite na mgbe ị bụ nwantakịrị.Ha ga-ahapụ gị gaa nʼụzọ nke aka ha;ị gaghị enwekwa onye ga-azọpụta gị.