1Bel na Nebo, arụsị ndị Babilọn makpu amakpu.Lee, arụsị niile ha ka ebukwasịrị ha nʼazụ ịnyịnya ibu.Arụsị niile apịrị apị bụ nke a na-ebugharị bụ ibu dị arọ,ibu arụ nye ụmụ anụmanụ na-ada mba!2Ha makpuuru, rudakọkwa ala nʼotu;ha enweghị ike iwezuga ibu ndị a nʼonwe ha,ha onwe ha kwa, a dọtala ha nʼagha.3“Geenụ m ntị, unu ụmụ ụmụ Jekọb,unu ndị fọdụrụ nʼụlọ Izrel,unu bụ ndị m na-elekọta siterị na mgbe a mụrụ ununa-akpọgharịkwa unu siterị na mgbe amụpụtara unu.4Mụ onwe m, bụ onye ahụ, ọ bụ m ga-elekọtakwa unu anya,ọ bụladị ruo mgbe isi awọ jupụtara unu nʼisi, nʼagadi unu.Nʼihi na ọ bụ m kere unu, aga m elekọtakwa unu.Aga m agba unu ume, bụrụkwa onye nzọpụta unu.5“Onye ka unu ga-asị na o yiri m? Onye kwa ka mụ na ya ha?Onye ka unu ga-eji tụnyere m?6Ụfọdụ mmadụ na-emeghe akpa ego ha wụpụta ọlaedo dị nʼime ya,na-atụpụtakwa ọlaọcha nʼihe ọtụtụ,were ya goo onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ka o jiri ya kpụọrọ ha chi,emesịa, ha na-akpọ isiala na-efe arụsị ahụ ofufe.7Ha na-ebuli arụsị ahụ buru ya nʼubu ha,buru ya debe ya nʼọnọdụ ya, nʼebe ahụ ka ọ na-akwụrụ.Ọ dịghị apụ site nʼebe ahụ jegharịa.Ọ bụrụ na mmadụ e tikuo ya mkpu, ọ gaghị aza,ọ pụghị ịzọpụtakwa ha pụọ na nsogbu ha niile.8“Chetanụ nke a, ma tuleekwa ya,ka ọ dịgidekwa unu nʼobi, unu ndị na-enupu isi.9Chetakwanụ ihe ndị ahụ niile mere nʼoge gara aga,nʼihi na abụ m Chineke, chi ọzọ adịghịkwa.Naanị m bụ Chineke, ọ dịkwaghị onye ọzọ dị ka m.10Ọ bụ m na-egosi ikpeazụ site na mmalite,ọ bụ m na-ekwu site na mgbe ochie ihe ga-eme nʼọdịnihu.Ana m asị, ‘nzube m ga-eguzogide.Ọ bụkwa ihe dị m mma nʼobi ka m ga-eme.’11Aga m esite nʼọwụwa anyanwụ kpọọ anụ ufe,e, sitekwa nʼala ebe dị anya kpọọ nwoke ahụ ga-abịa mee nzube m.Nʼihi na ihe m kwuru ya ka m ga-eme ka o mezuo;ọ bụkwa atụmatụ m ka m ga-emekwa.12Geenụ m ntị, unu ndị isi ike,unu ndị nọpụrụ ezi omume m nʼebe dị anya.13Ana m eweta ezi omume nso,ọ dịghị nʼebe dị anya,nzọpụta m agaghị anọkwa ọdụ.Aga m enye Zayọn nzọpụta,nyekwa Izrel ịma mma m.