1“Ma ugbu a, gee ntị gị Jekọb, bụ ohu m,geekwanụ ntị, unu ndị Izrel m họpụtara.2Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu,bụ onye kere unu, onye kpụrụ unu nʼime nʼafọ,na onye ga-enyere unu aka:Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m,atụkwala egwu gị Jeshurun, onye nke m họpụtara.3Nʼihi na aga m eme ka ala ahụ kpọrọ nkụ nweta mmiri,mee ka mmiri na-asọgharị nʼala ahụ akpịrị na-akpọ nkụ.Aga m awụkwasị ụmụ ụmụ unu Mmụọ m,meekwa ka ngọzị m dịrị ha.4Ha ga-etopụta etopụta dịka ahịhịa a gbara mmiri,e, dịka osisi pọpla nʼakụkụ iyi jupụtara na mmiri.5Ha ga-eji nganga sị, ‘Abụ m nke Onyenwe anyị,’maọbụ ‘Abụ m nwa nwa Jekọb,’ebe ndị ọzọ ga-edepụta nʼaka ha, ‘Nke Onyenwe anyị ka m bụ,’ha ga-agụkwa onwe ha Izrel.
Onyenwe anyị, ọ bụghị arụsị
6“Nke a bụ ihe Onyenwe anyị na-ekwu,onye bụ Eze Izrel na Onye mgbapụta ya, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile:Mụ onwe bụ Mmalite na Ọgwụgwụ;ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ewezuga m.7Ọ bụkwa onye dị ka m? Ya kwupụta ya.Ya kwupụta ya, doo ya nʼusoro ka ntị nụrụ!Ya kwupụta ihe niile mere kemgbe m mere ka ndị m guzosie ike.Ya kwupụtakwa, ma dokwaa ha nʼusoro,ihe niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu.8Unu atụla egwu. Unu amakwala jijiji.Ọ bụ na m akọpụtaghị ihe ndị a ma kwupụta ha nʼoge gara aga.Unu onwe unu bụ ndị akaebe m. Ọ dị chi ọzọ dị ma e wezuga m?Mba! O nweghị Oke nkume ọzọ dị, nke m maara ihe banyere ya.”9Ndị a niile na-apị arụsị bụ ndị nzuzu.Chi ndị ahụ niile ha na-agụ dị ka ihe ukwu bụkwa ihe na-enweghị isi.Ndị niile na-akpọ isiala nye chi ndị a bụ ndị kpuru ìsì,na ndị amamihe kọrọ, ndị ihere ga-emekwa.10Ọ baghị uru mmadụ ịkpụrụ onwe ya arụsị maọbụ chi a pịrị apị,nke na-apụghị inyere ya aka nʼụzọ ọbụla?11Lee ihere ga-eme ndị niile na-akpọ isiala nye ya.Ndị kpụrụ ha bụ naanị ndị mmadụ.Ka ha niile chịkọta onwe ha, guzo, nwee mkpebi ha,ha ga-anọ nʼọnọdụ nʼihere, na nʼoke egwu.12Ọkpụ ụzụ na-ewere ngwa ọrụ yana-ahụ ya nʼime icheku ọkụ,ọ na-eji mkpirisi igwe onye ọka tipịa ya nʼụdịdị arụsị,ọ bụ ike nke ogwe aka ya ka o ji akpụ ụzụ.Agụ na-agụ ya, ike na-agwụsịkwa ya;ọ ṅụghị mmiri ọbụla, ọ na-adakwa mba.13Onye ọka osisi na-esite nʼeriri ọtụtụ tụpụta osisiwere pensụlụ kaa ya;ọ na-ewere ngwa ọrụ ya kpụchaa osisi ahụ,were ngwa ọrụ ịka akara, kaa ya akara.Ọ na-arụ ya dịka oyiyi mmadụ,oyiyi mmadụ nʼịma mma ya niile,maka ibi nʼime ụlọ arụsị.14Ọ na-egbutu osisi sida dị iche iche,maọbụ osisi saipres ma ọ bụkwa osisi ook.Ọ na-ahapụ ya ka o too nʼetiti osisi dị iche iche nke oke ọhịa,maọbụ kụọ osisi fịa, nke mmiri ozuzo na-eme ka o too nke ọma.15Ọ bụkwa nkụ ka eji ya e mere;ụfọdụ ka ọ na-ewere nya ọkụ,ọ na-eji ya afụnwu ọkụ ghee achịcha.Sitekwa na ya pịa chi, kpuo ihu nʼala nye ya;ọ na-emekwa arụsị apịrị apị, kpọọ isiala nye ya.16Ọkara nʼime osisi ndị a ka o ji emenwu ọkụ;nʼelu ya kwa ka ọ na-esi nri ya,ọ na-ahụnye anụ, were tajuo afọ ya.Nkụ ahụ ka o ji anya ọkụ na-asị,“Ahaa, ahụ ekpola m ọkụ; ahụla m ọkụ.”17Ihe fọdụrụ nʼime osisi ahụ ka ọ na-ewere kwaara onwe ya arụsị a pịrị apị;Ọ na-ada nʼala nʼihu ya, fee ya ofufe.Ọ na-ekpekwara ya ekpere na-asị,“Biko, Zọpụta m, nʼihi na chi m ka ị bụ!”18Ha amaghị ihe ọbụla; ha adịghị aghọtakwa,nʼihi na-emechiela anya ha ka ha ghara ịhụ ụzọ,mechiekwa uche ha, ka ha ghara ịghọta.19Ọ dịghị onye na-anọdụ chee echiche,ọ dịghịkwa onye nwere ihe ọmụma maọbụ nghọta ị sị,“Ụfọdụ nʼime osisi a ka m ji kwanye ọkụ,Ọ bụladị ghee achịcha nʼelu icheku ọkụ ya,ejikwa m ụfọdụ nʼime ya hụọ anụ m tara.M ga-esite na nke fọdụrụ mepụta ihe rụrụ arụ?Ọ bụ ogwe osisi ka m ga-akpọ isiala nye?”20Onye na-adịghị eche ụdị echiche a bụ onye nzuzu, nke na-eji ntụ si nʼebe a kwanyere ọkụ na-azụ onwe ya.Ọ pụghị ịnapụta onwe ya, maọbụ jụọ onwe ya ajụjụ sị,“Ihe a m ji nʼaka m, nke m na-akpọ chi, ọ bụghị okwu ụgha ka ọ bụ?”21“Cheta ihe ndị a, gị Jekọb,nʼihi na gị bụ Izrel, ị bụ ohu m.Ọ bụ m kpụrụ gị, ị bụ ohu m;gị bụ Izrel, agaghị m echezọ gị.22Ehichapụla m njehie gị niile; dịka igwe ojii,hichapụkwa mmehie gị dịka igirigi ụtụtụ.Lọghachikwute m,nʼihi na akwụọla m ụgwọ ịgbapụta gị.”23Bụọnụ abụ oke ọṅụ, unu eluigwe, nʼihi na Onyenwe anyị emeela ya;tienụ oke mkpu, unu ụwa dị nʼala.Tienụ mkpu ọṅụ, unu ugwu niile,unu bụ oke ọhịa niile na osisi ọbụla nke dị nʼime gị,nʼihi na Onyenwe anyị agbapụtala Jekọb,na-egosikwa ebube ya nʼIzrel.
A ga-ebikwa na Jerusalem
24“Otu a, Onyenwe anyị na-ekwu,Onye mgbapụta unu, onye ahụ kpụrụ unu nʼime afọ:Mụ onwe bụ Onyenwe anyị,Onye kere ihe niile,onye gbatipụrụ eluigwe,onye gbasara ụwa naanị mụ onwe m,25onye na-emebi ihe ịrịbama niile nke ndị amụma ụghana-emekwa ka ndị na-ajụta ase ghọọ ndị nzuzu,onye na-ekpu ihe ọmụmụ ndị maara ihe ihu nʼalatụgharịa ya, ha ghọọ ihe nzuzu,26onye na-eme ka okwu ndị ohu ya mezuomeekwa ka amụma ndị ozi ya buru mezuo,onye na-asị banyere Jerusalem, ‘A ga-ebikwa nʼime ya ọzọ,’na-asịkwa banyere obodo niile nke Juda, ‘A ga-ewughachi ha,’banyere mkpọmkpọ ebe ha niile, ‘Aga m ewulikwa ha.’27Onye ahụ na-asị, ogbu mmiri, ‘Takọrọ,aga m emekwa ka iyi ya niile takọrọsịa,’28Onye na-asị banyere Sairọs, ‘Ọ bụ onye ọzụzụ atụrụ m,ọ ga-emezukwa ihe niile na-adị m mma;Ọ ga-asịkwa banyere Jerusalem, “Ka ewugharịa ya,”ma banyere ụlọnsọ, “Ka ehiwe ntọala ya.” ’