1Nʼoge ahụ, Hezekaya rịara ọrịa ruo na ọ gaara anwụ. Aịzaya onye amụma, nwa Emọz, bịakwutere ya, sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị sịrị: Dozie ezinaụlọ gị, nʼihi na ị ga-anwụ. Ị gaghị esite nʼute ọrịa a bilie.”2Hezekaya tụgharịrị chee ihu ya nʼaja ụlọ kpee ekpere nye Onyenwe anyị sị,3“Chetakwa, Onyenwe anyị, otu m si jegharịa nʼihu gị nʼikwesị ntụkwasị obi, jiri obi m niile fee gị ofufe, ma meekwa ihe dị mma nʼanya gị.” Hezekaya bekwara akwa nke ukwuu.4Mgbe ahụ, okwu nke Onyenwe anyị rutere Aịzaya,5“Gaa, gwa Hezekaya, sị ‘Otu a ka Onyenwe anyị, bụ Chineke nna gị Devid kwuru, anụla m ekpere gị, ahụkwala m anya mmiri akwa gị. Aga m atụkwasị afọ iri na ise nʼụbọchị ndụ gị.6Aga m anapụtakwa gị na obodo a site nʼaka eze Asịrịa. Aga m echebe obodo a.7“ ‘Nke a bụ ihe ịrịbama site nʼaka Onyenwe anyị nye gị, na Onyenwe anyị ga-emezu ihe a nke o kwere na nkwa.8Aga m eme ka anyanwụ laa azụ nzọ ụkwụ iri nʼihe nrigo ụlọ elu Ehaz.’ ” Ya mere, anyanwụ laghachiri azụ nzọ ụkwụ iri.9Ederede Hezekaya eze Juda, mgbe ọrịachara ọrịa, nwee ahụ ike:10Asịrị m, “Ọ bụ nʼoge m bụ okorobịaka m ga-agabiga nʼọnụ ụzọ nke ọnwụ,bụrụ onye anapụrụ oge ndụ m nke fọdụrụ afọdụ?”11Asịrị m, “Ọ dịkwaghị mgbe m ga-ahụ Onyenwe anyị ọzọnʼala ndị dị ndụ,m gaghị elegidekwa mmadụ ibe m anya ọzọ,maọbụ bie nʼetiti ndị bi nʼime ụwa a.12Esila nʼọnọdụ ya bupụ ụlọ mdịka ụlọ ikwu nke onye ọzụzụ atụrụ.Apịakọtala m ndụ m dịka ọkpa akwa si apịakọta akwao bipụla ndụ site nkwe-akwa,ehihie na nʼabalị, ị mere ka ndụ m gwụsịa.13Enwere m ntachiobi chere chi ọbụbọ.Ma dịka ọdụm ka ọ na-agbaji ọkpụkpụ m niile.Ehihie na nʼabalị ka ị na-eme ka ndụ m gwụsịa.14Dịka eleke maọbụ ụgbala ka m na-ebe akwa.Ana m asụ ude dịka nduru na-eru ụjụ.Ike gwụrụ anya m nʼihi ile anya nʼeluigwe.Anọ m nʼọnọdụ mkpagbu, Onyenwe anyị, bịa nyere m aka.”15Ma gịnị ka m ga-ekwu?Ya onwe ya gwara m sị na ọ bụ ya mere nke a.M ga-eji obi umeala gagharịa ụbọchị ndụ m niilenʼihi ihe mwute nke obi m.16Onyenwe anyị, ọ bụ nʼihi ihe ndị a ka mmadụ ji adị ndụ.Mmụọ m na-adịkwa ndụ nʼime ha.I nyeghachila m ahụ ike,mee ka m dị ndụ.17Nʼezie, ọ bụ nʼihi ọdịmma m,ka m ji taa ahụhụ nke ihe mgbu dị otu a.Nʼịhụnanya gị ka ị zọpụtara msite nʼolulu nke ịla nʼiyi.I werela mmehie m niilewefee nʼazụ gị.18Nʼihi nʼala mmụọ agaghị eto gị,ọnwụ agakwaghị abụku gị abụ otuto.Ndị na-arịda nʼoluluagaghị ele anya ikwesi ntụkwasị obi gị.19Ọ bụ ndị dị ndụ, e, naanị ndị dị ndụ ga-eto gị otuto,dị ka m na-eme taa.Ọ bụ otu ọgbọ na-eme ka ọgbọ na-eso hamata ihe banyere ikwesi ntụkwasị obi gị.20Onyenwe anyị ga-azọpụta m,anyị ga-abụ abụ kpọọ ụbọ akwaranʼụbọchị niile nke ndụ anyị,nʼime ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị.21Aịzaya ekwuolarị sị, “Kwadoonụ mmanụ fiig dị ọkụ tee ya nʼelu etuto ahụ, ahụ ga-adịkwa ya mma.”22Hezekaya jụrụ sị, “Gịnị ga-abụ ihe ịrịbama na m ga-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị?”