Aịzaya35ibo_bib

Ọnụ ndị a gbapụtara

1Nʼụbọchị ahụ, ọzara na ala kpọrọ nkụ ga-enwe obi ụtọ;okoko osisi mara mma ga-awapụtakwa nʼọzara.Dịka rozu,2ọ ga-agbawa ifuru jupụta;ọ ga-aṅụrị ọṅụ nke ukwuu, tiekwa mkpu ọṅụ.A ga-enye ya nsọpụrụ nke ugwu Lebanọn,nyekwa ya ịma mma nke ala ubi Sharọn na Kamel.Ha ga-ahụ ebube Onyenwe anyị nʼebe ahụ,ha ga-ahụkwa ịdị ukwuu nke Chineke anyị.
3Meenụ ka aka ndị ahụ kụdara akụda dịkwa ike,gbaakwanụ ụkwụ ndị ahụ na-asọ ngọngọ ume.4Gwanụ ndị ahụ na-atụ egwu sị ha,“Dịrịnụ ike, unu atụla egwu,nʼihi na Chineke unu na-abịa.Ọ ga-abịa ịbọtara unu ọbọ,ịkwụghachi ndị iro unu ihe ruuru ha.Ọ ga-abịa ịzọpụta unu.”
5Mgbe ọ bịara, ọ ga-emeghe anya ndị kpuru ìsì,meekwa ka ndị ntị chiri nụ ihe.6Ọ ga-eme ka onye ngwụrọ wulie elu dịka ele,meekwa ka ndị na-adịghị ekwu okwu tie mkpu ọṅụ.Mmiri ga-agbawapụta sọọ nʼọzara,mmiri iyi ga-ejupụtakwa nʼala kpọrọ nkụ.7Elu ala ahụ na-ere ọkụ nʼụkwụ ga-aghọ ọdọ mmiri.Ala ahụ nke mmiri kọrọ ga-aghọ isi iyi nke mmiri ga-ejupụta.Ebe ahụ nkịta ọhịa naara ebi ga-aghọ ala mmiri mmiri;ahịhịa, na ahịhịa riidi, na ahịhịa papịrọs, ga-epupụta nʼime ya.
8Okporoụzọ ga-adịkwa nʼebe ahụ,nke a ga-akpọ, Okporoụzọ Ịdị Nsọ,Ọ ga-adịrị naanị ndị ahụ na-agbaso Ụzọ ahụ.Ndị na-adịghị ọcha agaghị eje ije nʼelu ya,ndị nzuzu ajọ omume agaghị ejegharị nʼelu ya.9Ọdụm agaghị anọ nso ụzọ ahụ.Ọ dịkwaghị anụ ọhịa na-egbu mmadụ ga-aga nʼelu ya.E, agaghị ahụ anụ dị otu a nʼebe ahụ.Kama, ọ bụ naanị ndị a gbapụtara ga-eje ije na ya.10Ma ndị ahụ Onyenwe anyị gbapụtara ga-alọtakwa.Ha ga-eji abụ bata na Zayọn;ọṅụ na-adịgide ga-adịkwasị nʼisi ha.Oke ọṅụ na obi ụtọ ga-ejupụta nʼobi ha.Iru ụjụ na ịsụ ude ga-efelaga.