Aịzaya33ibo_bib

Nsogbu na enyemaka

1Ahụhụ dịrị gị, onye mbibi,onye bibiri ihe niile dị gị gburugburu, ma ọ dịbeghị mbibi rutere gị aka.Ahụhụ dịrị gị, onye nrafu,onye na-enwebeghị ndị rafuru gị.Mgbe ị kwụsịrị ibibi iheka a ga-ebibi gị,mgbe ị kwụsịkwara nrafuka a ga-arafu gị.
2Biko, Onyenwe anyị, nwee obi ebere nʼebe anyị nọ,nʼihi na ọ bụ gị ka anyị na-ele anya.Bụụrụ anyị ike nʼụtụtụ ụbọchị niile,bụrụkwara anyị onye nzọpụta mgbe niile anyị nọ na mkpa.3Ndị iro na-agba ọsọ mgbe ha nụrụ olu gị.Mgbe ị guzoro ọtọ, mba niile na-agbalaga.4Dịka igurube si atachapụ ihe dị nʼubi,otu a ka a ga-esi kwakọrọ ihe niile unu nwere nʼagha, unu mba dị iche iche.
5Onyenwe anyị dị elu, nʼihi na o bi nʼebe dị elu.Ọ ga-eji ikpe ya ziri ezi, na ezi omume mejupụta Zayọn.6Ọ ga-abụ ntọala guzosiri ike nke oge unu niile,ụlọakụ dị ukwu nke nzọpụta, na amamihe na ihe ọmụma;egwu Onyenwe anyị bụ igodo nke akụ a.
7Lee ndị ha dị ike ka ha na-eti mkpu akwa nʼokporoụzọ niile;ndị na-anọchite anya ha, ndị bịara ikwu otu udo ga-esi dịrị na-akwa akwa.8Ọ dịkwaghị onye a na-ahụ anya nʼokporoụzọ ọbụla.E meela ka ọgbụgba ndụ niile ghara ịdịkwa ire.A na-elelị ndị e sitere nʼakaebe hamee ka ọgbụgba ndụ ahụ guzosie ike.Ọ dịkwaghị onye a na-asọpụrụ.9Ala ahụ niile na-eru ụjụ. Ọ tọgbọkwara nʼefu.Oke ọhịa Lebanọn akpọnwụọla bụrụ ihe ihere.Sharọn aghọkwaala ọzara;osisi dị na Bashan na nʼelu ugwu Kamel na-agbụchakwa akwụkwọ ha.
10Ma Onyenwe anyị na-asị, “Ugbu a, m ga-ebili.”“Ugbu a, ka a ga-eme ka m dị elu;ugbu a, ka a ga-ebuli m elu.11Unu na-atụ ime ahịhịa kpọrọ nkụ,unu na-amụpụta ahịhịa,nkuume unu na-ekupụta bụ ọkụ ga-erepịa unu.12Ndị gị ga-ere ọkụ, dịka osisi ogwu e gbuturu egbutu tụnye nʼọkụ;ha ga-ere ọkụ dịka avụvụ nkwụ.”
13Geenụ ntị nụrụ ihe m mere, unu mba niile dị nʼebe dị anya!Unu ndị nọ nso, kwerenụ nʼezie na m siri ike!14Ndị mmehie na ndị ajọ omume nọ na Zayọn na-ama jijiji nʼegwu,ha na-akwa akwa na-asị,“Onye nʼime anyị pụrụ ibi nʼebe a, nʼetiti onye a bụ ọkụ na-erepịa erepịa,ọkụ nke na-ere ruo mgbe ebighị ebi?”15Ndị na-ejegharị nʼezi omumena-ekwu ihe ziri ezi,ndị na-ajụ uru sitere nʼụzọ nʼezighị ezi,ndị na-ewezuga aka ha site na ịnata ngarị dị iche iche,ndị na-emechi ntị megide izu ịkwafu ọbara,na-amụchi anya ha abụọ ka ha ghara ịtụgharị uche nʼihe ọjọọ.16Ha bụ ndị ahụ ga-ebi nʼebe dị elu,ndị ebe mgbaba ha ga-abụ ebe e wusiri ike nke ugwu.A ga-enye ha nri,mmiri a gaghị akọkwa ha.
17Anya unu ga-ahụ eze nʼebube ya;unu ga-ahụkwa alaeze ya nke nsọtụ oke ya dị nʼebe dị anya.18Nʼime echiche obi unu, unu ga na-atule ihe oke egwu nke oge ndị ahụ gara aga.“Olee ebe onyeisi ọchịchị ahụ nọ ugbu a?Ebee ka onye na-anakọta ụtụ ahụ nọ?Ebeekwa ka onyeisi ahụ nke ụlọ elu nche niile dị nʼaka ya nọ?”19Nʼoge ahụ, unu agaghị ahụkwa ndị nganga ahụ ọzọ,bụ ndị ahụ na-asụ asụsụ nke unu na-amaghị,nke unu na-adịghị aghọtakwa.
20Lekwasịnụ Zayọn anya, obodo anyị na-anọ eme mmemme anyị niile;anya unu ga-ahụkwa Jerusalem,ụlọ obibi dị jụụ, ụlọ ikwu nke a na-apụghị ibupụ ebupụ;apụghịkwa iholite ǹtu jidere ya,maọbụ dọbie nke ọbụla nʼime ụdọ ji ya.21Ebe ahụ ka Onyenwe anyị ga-abụrụ anyị Onye dị ike.Ọ ga-adịkwara anyị ka osimiri na iyi dị obosara.Ọ dịghị ụgbọ amaramaọbụ ụgbọ ukwu ga-abịa na mmiri ahụ.22Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ikpe anyị.Onyenwe anyị bụ onye na-enye anyị iwu.Onyenwe anyị bụ eze anyị,ọ bụ ya na-azọpụta anyị.
23A tọsaala ụdọ niile:Ha adịghị ejidesikwa ọkọlọtọ gị ike,a gbasaghịkwa akwa igbochi ifufe.Mgbe ahụ, a ga-ekesa ụba ihe a kwatara nʼaghaọ bụladị ndị ngwụrọ ga-ebute ihe nkwata nʼagha.24Ọ dịkwaghị onye bi na Zayọn ga-asị, “Ahụ esighị m ike,”nʼihi na a ga-agbaghara ndị bi nʼime ya mmehie ha niile.