1Ahụhụ dịrị ndị na-aga Ijipt ịchọ enyemaka,ndị nchekwube ha dị nʼike ndị ha na-agba ịnyịnya,ndị na-atụkwasị obi ha nʼụgbọala ha, nke dị ọtụtụ,ndị na-atụkwasịkwa obi ha nʼịdị ike nke ndị Ijipt na-agba ịnyịnya.Ma ha adịghị ele anya inyeaka site nʼaka Onye Nsọ Izrel;ha adịghị arịọkwa ya ka Onyenwe anyị nyere ha aka.2Ma ya onwe ya maara ihe, ọ pụrụ iweta ịla nʼiyi.Ọ dịkwaghị agbanwe okwu ya.Ọ ga-ebili megide ndị mba na-eme ihe ọjọọ;ha na ndị niile na-enyere ndị na-eme ajọ ihe aka.3Nʼihi na ndị Ijipt bụ naanị mmadụ, ha abụghị Chineke!Ịnyịnya ha nwekwara anụ ahụ, ha abụghị mmụọ.Mgbe Onyenwe anyị setịpụrụ aka ya imegide ha,ha ga-asọ ngọngọ;ndị ha na-enyere aka ga-adakwa.Ha niile ga-alakọkwa nʼiyi.4Ma ihe ndị a ka Onyenwe anyị gwara m,“Dịka ọdụm na-agbọ ụja,na-ebigbọ nʼelu anụ ọ dọgburu,nʼagbanyeghị na-akpọkọtara igwe ndị ọzụzụ atụrụimegide ya,ọ naghị atụ egwu mkpu ha,mkpọtụ ụzụ ha adịghị enyekwa ya nsogbu,Otu a kwa, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-arịdataibu agha nʼugwu Zayọn, na nʼugwu nta ya niile.5Dịka nnụnụ si efegharị nʼelu akwụ ya ichebe ụmụ ya,otu a ka mụ bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-esi chebe Jerusalem,ọ ga-ekpuchi ya napụta ya,ọ ghaghị ịgabiga ya, gbapụtakwa ya.”6Lọghachitenụ azụ, unu bụ Izrel, laghachikwurunụ onye ahụ nke unu nupuru isi nʼebe ọdị ukwuu megide.7Amaara m nke ọma na ụbọchị ahụ na-abịa, mgbe onye ọbụla nʼime unu ga-atụfu arụsị ọlaedo na ọlaọcha niile nke aka mmehie unu kpụrụ.8“Mgbe ahụ, Asịrịa ga-ada, kama ọ bụghị site na mma agha mmadụ,mma agha na-abụghị nke mmadụ efu ga-erichapụ ha.Ha ga-esi nʼihu mma agha gbaa ọsọ,ma ụmụ okorobịa ha ka a ga-akpụrụ tinye nʼọrụ mmanye.9Obodo ha niile e wusiri ike ga-ada nʼihi oke egwu,ndị ọchịagha ha ga-atụkwa ụjọ mgbe ha hụrụ ọkọlọtọ agha.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.Onye ọkụ ya dị na Zayọn,onye ekwu igwe ọkụ ya dị na Jerusalem.