1Ahụhụ ga-adịrị gị, gị bụ Ariel, Ariel,gị obodo ebe Devid bi.Gbakọnyenụ otu afọ nʼafọ ọzọnke unu ga-eji rie oriri, mee mmemme.2Ma aga m akpagbu Ariel,ọ ga-eru ụjụ, ma bee akwa,ọ ga-adị ka ala ebe ịchụ aja.3Aga m ama ụlọ ikwu m nʼakụkụ gị niile gburugburu,aga m eji ọtụtụ ụlọ elu gba gị gburugburudokwaa ihe nnọchibido m niile megide gị.4Nʼọnọdụ mweda nʼala, ị ga-ekwu okwu site nʼala,okwu ọnụ gị ga-esikwa nʼuzuzu pụta.Olu gị ga-ada ka nke onye mmụọ site nʼala,ọ bụ site nʼuzuzu ka okwu ọnụ gị na-ada ntakịrị ntakịrị ga-esi pụta.5Ma igwe ndị iro gị ga-aghọ ntụ,igwe ndị na-adịghị eme obi ebere ga-adịkwa ka igbugbo ọka nke ifufe na-ebufu.Mgbe ahụ, na mberede,6mụ onwe m, bụ Onyenwe anyị,Onye pụrụ ime ihe niile, ga-eji egbe eluigwe na ala ọma jijijina oke ifufe na oke ụzụ, na ọkụ na-erepịa erepịa, bịakwute ha.7Mba niile ahụ, ndị na-ebuso Ariel agha,bụ ndị na-ebuso ya na ebe ya e wusiri ike agha,ga-efu dịka nrọ,onye na-arahụ ụra nʼabalị rọrọ.8Dịka mgbe onye agụụ na-agụ, nke na-arọ nrọ ebe ọ na-eri nri,ma agụụ nọkwa na-agụ ya mgbe o si nʼụra teta.Dịka onye agụụ mmiri na-agụ, nke nọ na nrọ hụ mmiri ọ na-aṅụ,ma teta nʼụra chọpụta na akpịrị na-akpọsị ya nkụ ike, na-adakwa mba.E, otu a ka ọ ga-adịmgbe igwe ndị agha mba ahụ niile ga-ebuso ugwu Zayọn agha.9Ka ọ gbagwojuo unu anya. Ka o jukwa unu anya.Kpuonụ onwe unu ìsì ka unu ghara ịhụ ụzọ.Ṅagharịanụ ma ọ bụghị site na mmanya unu ṅụrụ,sọọnụ ngọngọ ma ọ bụghị site na mmanya na-aba nʼanya.10Nʼihi na Onyenwe anyị awụkwasịla unu mmụọ nke oke ụra.O mechiela anya ndị amụma unu niile,kpuchie isi ndị niile na-ahụ ọhụ.11Ihe ndị a niile na-aga ime nʼoge dị nʼihu dịka akwụkwọ a kara akara. Mgbe e weere ya nye onye ma akwụkwọ ka ọ gụọ, ọ ga-asị, “Enweghị m ike, nʼihi na a kaala ya akara.”12Mgbe e weere ya nye onye na-amaghị akwụkwọ, ọ ga-asị, “Ewela iwe, amaghị m agụ.”13Onyenwe anyị sịrị,“Ndị a ji ọnụ ha na-abịa m nso,ha ji egbugbere ọnụ ha na-asọpụrụ m,ma obi ha dị anya nʼebe m nọ.Ofufe ha na-efe m, bụ nkegbadoro ụkwụ nʼihe mmadụ nyere nʼiwu, bụkwa nke a kuziiri ha.14Ya mere, otu ugboro ọzọ, aga m eme ndị a ihe oke iju anyajiri ihe ịtụnanya tụkwasị nʼelu ihe ịtụnanya,amamihe nke ndị maara ihe ga-ala nʼiyi,nghọta nke ndị nwere nghọta ga-agba barịị.”15Ahụhụ ga-adịrị ndị na-echena ha na-ezonarị Onyenwe anyị nzube ha,ndị na-agbalịsị ike ime ihe ha zubere na nzuzo, ma na-asịrịta onwe ha,“Chineke agaghị ahụ anyị. Ọ maghị ihe anyị na-eme!”16Lee ka unu si ekpu ihe ihu nʼala,ka a ga-asị na ọkpụ ite dị ka ụrọ e ji akpụ ite.Ihe mmadụ kpụrụ o nwere ike ịtụgharị gwa onye kpụrụ ya, sị,“Ị kpụghị m”?Ka ite o nwere ike ị sị ọkpụ ite,“Ị ghọtaghị ihe ọbụla”?17Mgbe na-adịghị anya ọ bụ na Lebanọn agaghị aghọ ala ubi na-emepụta ihe,ala ubi ahụ na-emepụta ihe ga-adịkwa ka oke ọhịa?18Nʼụbọchị ahụ, ndị ntị chiri ga-anụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ ahụ,ndị ìsì, ndị ahụ naara ejegharị nʼọchịchịrị ga-emeghe anya ha,hụkwa ụzọ ọzọ.19Ndị dị umeala nʼobi, na ndị ogbenye nʼetiti ndị mmadụ ga-achọta ọṅụ na obi ụtọnke Onyenwe anyị Onye dị nsọ nke Izrel na-enye.20Ndị na-adịghị enwe obi ebere agaghị adịkwa;ndị niile na-akwa emo agaghị adịkwa,ndị niile echiche ha bụ ime ajọ ihe ka a ga-ebipụ ndụ ha,21bụ ndị ahụ na-eme ka e site nʼokwu ọnụ ha mee onye ọzọ onye ikpe mara,ndị na-eme ka onye na-ekpechite ọnụ onye a na-emegbu emegbu maa nʼọnya,ndị na-eji ịgba akaebe ụgha mee ka ikpe ziri ezi hapụ irute ndị ezi omume aka.22Ya mere, nke a bụ ihe Onyenwe anyị onye gbapụtara Ebraham na-agwa ụlọ Jekọb,“Ndị m, a gaghị emekwa ka ihere mee unu ọzọ.Ihu unu agaghị agbarụkwa ọzọ.23Mgbe ha hụrụ ụmụ ha,bụ ọrụ aka m abụọ, nʼetiti ha,ha ga-edo aha m nsọ,ha ga-ekwupụta, nabatakwa ịdị nsọ nke Onye nsọ Jekọb,ha ga-eguzokwa nʼihu Chineke Izrel nʼegwu na nʼịma jijiji.24Ndị na-akpafu nʼime mmụọ ha ga-enweta nghọta,ndị ntamu ga-achọkwa ka ha mụta ihe.”