Aịzaya28ibo_bib

Ahụhụ dịrị ndịisi Ifrem na Juda

1Ahụhụ ga-adịrị okpueze okoko ọhịa ahụ, nke bụ mpako Ifrem,obodo ahụ ndị ya na-aṅụbiga mmanya oke ji anya isi.Obodo ahụ e wukwasịrị na mbara ala ndagwurugwu mara mma.Obodo ahụ ịma mma ya na-ada dịka okoko osisi e kpukwasịrị ndị ndu ya mmanya na-egbu nʼisi.2Lee, Onyenwe anyị nwere otu onye dị ike, onye nwekwara ume,dịka oke mmiri ozuzu nke akụmmiri igwe na dịka oke ifufe na-eweta mbibi,dịka oke mmiri ozuzo na-erubiga oke na dịka oke mmiri ozuzo bu idee mmiri ji ike ekwo,ọ ga-eji ike tụpụ ya nʼala.3Okpueze okoko osisi, bụ mpako nke ndị Ifrem na-aṅụbiga mmanya oke,ga-abụ ihe a ga-azọtọkwa nʼokpuru ụkwụ.4Okoko ọhịa nke na-akpọnwụ akpọnwụ, nke bụ ebube ịma mma ya,nke dị nʼisi ndagwurugwu na-emepụta ihe,ga-adị ka mkpụrụ fiig chara tupu oge owuwe ihe ubi eruo,nke mgbe onye ọbụla hụrụ ha na-ewere ha nʼaka,tinye nʼọnụ ya, loo ha.
5Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nʼonwe ya,ga-aghọrọ ndị ya fọdụrụ nʼala ahụokpueze mara mma,ọ ga-aghọkwara ha okoko mara mma.6Ọ ga-abụ mmụọ nke ikpe ziri ezinye ndị ikpe.Ọ ga-abụkwa ikenye ndị na-achụghachi ndị iro azụ nʼọnụ ụzọ ama.
7Ndị a kwa na-adagharị site na mmanyasitekwa nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya.Ndị nchụaja na ndị amụma na-adagharị site na ihe ọṅụṅụ na-aba nʼanya,mmanya emeela na ha amakwaghị ihe ha na-eme;ha na-adagharị site nʼihe ọṅụṅụ na-aba nʼanyaha na-adagharị mgbe ha na-ahụ ọhụ dị iche iche,ha na-asọ ngọngọ mgbe ha nʼekpe ikpe.8Nʼihi na tebul ha niile jupụtara nʼihe ọgbụgbọ ruru unyi.O nwekwaghị ebe dị ọcha.
9“Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ikuziri ihe?Ọ bụ onye ka ọ na-achọ ka ọ ghọta ozi ya?Ọ bụ ụmụnta ndị a kwusịrị ịṅụ mmiri ara,bụ ndị a ka napụrụ ara?10Nʼihi na ọ na-agbalị izi anyị ihe dịka e si dee ya,ahịrị ime nke a, nʼahịrị ime nke ọzọ,nʼusoro tụkwasị nʼusoro,nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ.”
11Nʼezie, Chineke ga-eji ndị na-asụ asụsụ unu na-amaghịzi unu ihe.12Nʼihi na ọ gwara unu okwu sị,“Lee, nke a bụ ebe izuike ahụ, ebe onye ike gwụrụ nwere ike ịnọ zuru ike;nke a bụ ebe ịgbaume ahụ.”Ma ha jụrụ ige ya ntị.13Ọ bụ nʼihi ya ka e ji na-ezi unu okwu Onyenwe anyịnʼahịrị nʼahịrị,nʼusoro nʼusoro;nwantịntị nʼebe a, nwantịntị nʼebe ahụ,ka unu gaa sụọ ngọngọ dalaa azụ,ka unu bụrụ ndị e tihịara ahụ, ndị ọnya mara, ndị e jidekwara.
14Nʼihi nke a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị na-akwa emo,ndị ọchịchị Jerusalem dị nʼaka.15Nʼihi na unu ekwuola sị, “Anyị na ọnwụ agbaala ndụ,anyị na ala mmụọ enwekọọkwala otu mkpebi.Mgbe ịla nʼiyi ahụ dị ukwuu ga-esi nʼebe anyị nọ gafee,ọ gaghị erute anyị,nʼihi na anyị emeela ka okwu ụgha bụrụ ebe mgbaba anyị;ọ bụkwa nʼime okwu ụgha ka anyị na-ezo onwe anyị.”16Ma otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị,“Lee, ana m atọgbọ na Zayọn otu nkume, nke anwapụtarala.Nkume nkuku dị oke ọnụahịa, nʼihi ntọala siri ike.Onye nke kweere na yaegwu agaghị ejide ya.17Ikpe ziri ezi ga-abụ eriri ọtụtụ nke ji atụ ihe,ezi omume ga-abụkwa ihe ịtụ mgbidi;akụmmiri nke oke mmiri ozuzo, ga-ekpochapụ ebe mgbaba unu, okwu ụgha unu,mmiri ga-etojukwa nʼebe nzuzo unu.18Mgbe ahụ, a ga-akagbu ọgbụgba ndụ ahụ unu na ọnwụ gbara;mkpebi unu na ala mmụọ agaghị eguzokwa.Mgbe oke ịla nʼiyi ahụ si nʼebe unu nọ na-agafe,ọ ga-azọda unu.19Mgbe ọbụla o si nʼebe unu nọ na-agafe, ọ ga-eburu unu,maọbụ nʼụtụtụ, ehihie, maọbụ nʼabalị,oge niile, mgbe mgbe.”Mgbe ahụ, obi unu ga-aghọta okwu Chineke;ọ ga-ewetara unu ahụ ịma jijiji.20Ihe ndina dị mkpụmkpụ, mmadụ enweghị ike esetipụ onwe ya nʼelu ya;akwa mkpuchi dị oke warawara, mmadụ enweghị ike iji ya fụchizie ahụ nke ọma.21Onyenwe anyị ga-ebili dịka o mere nʼugwu Perazim,ọ ga-akpalị onwe ya dịka o mekwara na Ndagwurugwu Gibiọn,ịrụ ọrụ ya, ọrụ ya nke dị ike nʼịkọwa,na ịrụzu ọrụ ya, ụdị nke a na-atụghị anya ya.22Ugbu a, ya mere, kwụsịnụ ịkwa emo,ka a ghara ime ka ahụhụ unu dị ukwuu karịa.Nʼihi na Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niileagwala m na o kpebiela ịla unu nʼiyi.
23Geenụ ntị, nụrụnụ olu m,ṅaanụ ntị nʼihe m na-agwa unu.24Ọ bụ ụbọchị niile ka onye ọrụ ubi na-akọ ala ubi ya hapụ ịkụnye ya mkpụrụ?Ọ bụ mgbe niile ka ọ na-egwuze ala ubi ya ime ka ọ dị larịị, ma ọ gaghị akụnye ya mkpụrụ ọbụla?25Mgbe o gwuzesịrị ya,ọ naghị aghasa mkpụrụ karawe, ghasaakwa kumin?Ọ bụ na ọ naghị akụnye ọka wiiti nʼahịrị nke ya,ọka balị nʼebe o kwesiri,na spelti nʼebe o kwesiri?26Ọ maara ihe o kwesiri ime,nʼihi na Chineke na-ezi ụzọ ziri ezi.
27Nʼihi na ejighị igwe eji azọcha mkpụrụ ọka etichapụta mkpụrụ karawe,maọbụ kpọree ụkwụ igwe nʼelu kumin,kama ọ bụ mkpọrọ ka e ji etichapụta kumin,werekwa osisi nta kwesiri ekwesi kupụta karawe.28A na-akwọ ọka e ji eme achịcha akwọ,ọ bụghị ruo mgbe ebighị ebi ka a na-anọgide na-etichapụta ya.E nwere ike jiri ụkwụ igwe ụgbọala ịnyịnya na-adọkpụ zọchaa ha,ma ọ bụghị ka a kwọpịasịa mkpụrụ ha.29Ihe ndị a niile na-esite nʼaka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-abịa,onye nzube ya dị ịtụnanya,onye amamihe ya dị ebube.