Aịzaya27ibo_bib

Mgbapụta dịrị Izrel

1Nʼụbọchị ahụ,Onyenwe anyị ga-eji mma agha yaiwe ya, dị ukwuu dịkwa ezigbo ike,taa agwọ ahụ na-akpụ akpụ bụ Leviatan ahụhụ.Leviatan bụ agwọ mgbakọ ahụ;ọ ga-egbukwa nnukwu anụ ọjọọ ahụ nke bi na mmiri.2Nʼụbọchị ahụ,abụ a ga-adị nʼọnụ ha, abụ ha ga-abụ banyere ubi vaịnị nke na-amị ezi mkpụrụ.3“Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị na-elekọta ya,ana m agba ya mmiri ụbọchị niile,na-eche ya nche ehihie na abalị.Ka onye ọbụla ghara iji ihe ọjọọ leta ya.4Adịghị m ewekwa iwe.Ọ bụrụ na ọ bụ naanị ogwu na uke na-echere m aka mgba,aga m ebili buso ha agha,aga m esurekwa ha ọkụ.5Ma ọ bụghị otu a, ka ha bịakwute m maka nchekwa,ha bịa ka mụ na ha mee udo.E, ha bịa ka mụ na ha mee udo.”
6Nʼụbọchị ndị na-abịa, Jekọb ga-agba mgbọrọgwụ.Izrel ga-agbawa okoko dịka osisi, maakwa ifuru,jirikwa mkpụrụ mejupụta ụwa niile.
7Onyenwe anyị atabeghị Izrel ahụhụdịka o si taa ndị iro ya.O mebekwaghị ka e gbuo ndị yadị ka e si gbuo ndị iro ha.8Onyenwe anyị tara ndị ya ahụhụ, mee ka a dọrọ ha nʼagha ma buru ha gaa mba ọzọ.Ọ bụ ifufe ọjọọ nke si nʼọwụwa anyanwụka o ji bupụ ha.9Ọ bụ nʼụzọ dị otu a ka a ga-esi bupụ ikpe ọmụma dịrị Jekọb,nke a bụkwa iju eju nke mkpụrụ e ji wezuga mmehie ya:Mgbe ha gweriri nkume niile ha ji wuo ebe ịchụ aja arụsị hadịka ntụ,mgbe ha wezugara ogidi arụsị Ashera,na ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile.10Obodo ahụ e wusiri ike adakpọsịala.Ọ ghọọla ọzara nke ndị mmadụ na-ebighị nʼime ya.Ọ ghọọkwala ebe ụmụ ehi na-akpa nri,ebe ha na-amakpu na-ezu ike.Ha ga-atacha ahịhịa dị nʼalaka osisi.11Mgbe alaka osisi ndị ahụ kpọnwụrụ daa,ụmụ nwanyị ga-abịa chịkọtaa ha were ha kwanye ọkụ.Nʼihi na ndị a bụ ndị na-enweghị nghọta.Ọ bụ nke a mere Onye kere ha adịghị emere ha ebere.Onye ahụ kpụrụ ha agakwaghị egosi ha obi ebere.12Nʼụbọchị ahụ, Onyenwe anyị ga-ahọcha site nʼebe mmiri na-eru eru Yufretis ruo na Wadi nke Ijipt, ma gị, bụ Izrel ka a ga-achịkọta otu nʼotu.13Nʼụbọchị ahụ, opi ike ga-ada. Ndị ahụ na-ala nʼiyi nʼAsịrịa na ndị ahụ e mere ka ha gaa biri nʼIjipt dịka ndị mba ọzọ ga-abịa fee Onyenwe anyị ofufe nʼugwu nsọ ya dị na Jerusalem.