Aịzaya24ibo_bib

Mbibi Onyenwe anyị ga-ebibi ụwa

1Lee, na Onyenwe anyị na-aga ịgba ụwa ọtọ.Ọ na-aga ime ka ọ tọgbọrọ nʼefu.Ọ na-aga ibibicha ihe dị nʼelu ụwa,mee ka ndị bi nʼime ya gbasasịa.2Otu ihe ahụ ka ọ ga-eme mmadụ niile,nye ndị nchụaja ma ndị mmadụ,nye ụmụodibo na ndị nwe ha,nye ndị odibo nwanyị, na nne ha ukwu,nye ndị na-azụ ihe a na-ere ere, na ndị na-ere ihe orire;nye ndị na-ebinye ego, na ndị a na-ebinye ego;nye ndị ji ụgwọ, na ndị e ji ụgwọ.3O nweghị onye ọ ga-ahapụ.A ga-agba ala ahụ ọtọ kwakọrọ ihe niile dị nʼime ya.Nke a ka Onyenwe anyị kwuru.
4Ala atakọchaala, ma kpọnwụọ.Ụwa ahụjuola anya ma kpọnwụọ.Eluigwe na nʼụwa so na-ahụjukwa anya.5Ụwa bụ ihe e merụrụ emerụ site na ndị ya;ha enupula isi nʼiwu niile,ha agbanweela ụkpụrụ ya,mebie ọgbụgba ndụ ebighị ebi ahụ.6Ya mere, ọbụbụ ọnụ na-eripịa ụwa;ndị bi nʼime ya aghaghị ịnatakwa ikpe ọmụma ha.Ya mere ndị niile bi nʼụwa na-ere ọkụ,ọ bụkwa naanị mmadụ ole na ole fọdụrụ.7Mmanya ọhụrụ atakọrọla, osisi vaịnị akpọnwụọkwala,nʼihi ya, ndị ahụ niile ọṅụ na-ejupụta nʼobi ha na-asụ ude.8Egwu ụtọ niile akwụsịla,mkpọtụ nke ndị na-eri oriri dị iche iche akwụsịla.Ụda obi ụtọ nke ụbọ akwara adịghịkwa.9Abụ obi ụtọ nke ya na mmanya na-eso adịghịkwa;mmanya dị ike na-akụzi ilu nʼọnụ ndị na-aṅụ ya.10Obodo atọgbọrọla nʼefu;a kpọchichaala ọnụ ụzọ e si abata ụlọ ndị mmadụ ka onye ọbụla ghara inwe ike ịbata.11Igwe ndị mmadụ nọ nʼokporoụzọ na-eti mkpu nʼihi na mmanya adịghịkwa.Ọṅụ adịghịkwa,otu a, ewezugakwala obi ụtọ site nʼụwa.12Obodo ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe,e tikpọọla ọnụ ụzọ ya niile.13Otu a ka ọ ga-adị nʼụwa niile,nakwa nʼetiti mba niile,dịka mgbe a na-etitusi mkpụrụ dị nʼelu osisi oliv,maọbụ mgbe ahapụrụ ụfọdụ mkpụrụ grepu nʼelu osisi mgbe a ghọchasịrị ihe ubi.
14Ma ndị niile fọdụrụ ga-eti mkpu ọṅụ;ndị nọ nʼọdịda anyanwụ ga-eto ịdị ebube nke Onyenwe anyị.15Ndị nọ nʼọwụwa anyanwụ ga-enye Onyenwe anyị otuto.Ndị bi nʼala nta niile osimiri gbara gburugburuga-ebuli aha Onyenwe anyị, Chineke Izrel elu.16Anyị ga-anụ abụ ọma dị iche iche site na nsọtụ ụwa.Ha ga-abụ abụ na-asị, “Otuto dịrị Onye ezi omume ahụ.”Ma nʼezie, o nweghị olileanya dịịrị m. “Lee ka anụ ahụ m si na-akpọnwụ!Ahụhụ dịrị m!Nʼihi na ndị ahụ na-ekwesighị ntụkwasị obi ereela anyị.Akpịrị ego ha ka ha ji refuo anyị.”17Ihe egwu, na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya dị na-eche unu,unu ndị niile bi nʼụwa.18Onye ọbụla nʼime unu nke gbara ọsọ nʼihi ihe egwuga-adaba nʼolulu;onye ọbụla sitekwara nʼolulu rịpụtaga-azọnye ụkwụ ya nʼọnya.Nʼihi na mmiri nke ịla nʼiyi esitela na mbara eluigwe na-ezokwasị unu.Ntọala ụwa na-amakwa jijiji.19Ụwa adapịasịala;ụwa agbawasịala;e jirila oke ike nugharịa ụwa.20Ụwa ga-adagbugharị dịka onye mmanya na-egbu.Ọ ga-aṅagharịkwa dịka osisi nke oke ifufe na-efegharị.Ọ daala, ọ pụghịkwa ibili ọzọ,nʼihi na njehie ya dị arọ na-anyịdakwa ya.
21Nʼụbọchị ahụ,Onyenwe anyị ga-ata ike usuu niile dị nʼeluigwe ahụhụ.Ọ ga-atakwa ndị eze niile nʼụwa ahụhụ.22A ga-achịkọta ha dịka ndị mkpọrọ,kpọchiekwa ha nʼụlọ mkpọrọnʼebe ahụ ka ha ga-anọgide,tutu ruo mgbe a ga-ekpe ha ikpe.23Ọnwa ga-ada mba,anwụ ka ihere ga-eme;nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ga-achịnʼugwu Zayọn nakwa nʼime Jerusalem,ọ ga-eji oke ebube chịa nʼihu ndị okenye ya.