Aịzaya21ibo_bib

Amụma e buru banyere Babilọn

1Amụma megide ọzara nke dị nʼakụkụ oke osimiri:Dịka oke ifufe si nʼọzara Negeb na-efebiga,ka onye na-eme ihe ike ga-esi nʼọzara bịa,site nʼala nke oke egwu.
2Ahụrụ m ọhụ dị egwu, ọhụ oke mbibi,na ọhụ oke nrara nye nʼaka ndị mbibi, nʼebe onye na-apụnara mmadụ ihe nʼike na-akwakọta ngwongwo.Bilienụ unu ndị agha Elam, buonu agha! Unu ndị agha Midia, gbaanụ obodo gburugburu!Aga m eme ka ịsụ ude na mmegbu niile kwụsị.
3Nʼihi nke a, ahụ m niile nọ nʼoke ihe mgbu,oke ihe mgbu zuru m ahụ, dịka ihe mgbu nke nwanyị ime na-eme.Amara m jijiji nʼihi ihe m nụrụ,ihe m na-ahụ na-agbagwoju m anya.4Obi m anọkwaghị jụụ,oke ọma jijiji na-eme ka m tụọ egwu;chi ojiji nke m na-ele anya yaaghọọlara m ihe ịma jijiji.
5Ha na-akwado tebul.Ha na-edozi ute ịnọdụ ala,ha na-eri, ha na-aṅụ.Bilienụ ndịisi agha,teekwanụ ọta niile mmanụ!6Ihe a ka Onyenwe anyị gwara m,“Gaa, guzobe onye nche,ka o kwuo ihe ọ na-ahụ.7Mgbe ọ hụrụ ụgbọ agha,na usuu ịnyịnya,na ndị na-agba ịnyịnya ibu,maọbụ ndị na-agba ịnyịnya kamel ka ha na-abịa abụọ abụọ,gwa ya ka o lezie ha anya nke ọma,nọọkwa na njikere.”8Onye nche na-elepụ anya tiri mkpu dịka ọdụm, sị,“Onyenwe m, nʼehihie ụbọchị niile ka m na-eguzo nʼelu ụlọ nche,nʼọnọdụ nche m ka m na-eguzokwa abalị niile.9Lee, otu nwoke nọ nʼime ụgbọ agha na-abịa,ya na ndị nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa abụọ abụọ.O nyeghachiri ọsịsa ahụ,‘Babilọn adaala, e ọ daala,arụsị niile apịrị apị nke chi ya niilea kurisiela tọgbọrọ nʼala.’ ”
10O, ndị m, ndị a zọchara azọcha, dịka ọka a zọchara nʼebe ịzọcha ọka,agwala m unu iheOnyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niilebụ Chineke Izrel kwuru.

Amụma banyere Edọm

11Nke a bụ amụma megide Duma:Otu onye si na Sia na-akpọ m oku,“Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?Onye nche, gịnị ka ọ fọdụrụ tupu chi abọọ?”12Onye nche zara sị,“Chi ọbụbọ na-abịa, abalị na-abịakwa.Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ ajụjụ, jụọnụ ajụjụ,ma laghachikwa ọzọ.”

Amụma e buru banyere Arebịa

13Amụma megide Arebịa:Unu ndị ije niile nke Dedan,ndị na-anọ ọnọdụ abalị nʼoke ọhịa nke Arebịa,14kuterenụ ndị ahụ bịakwutere unu akpịrị na-akpọ nkụ mmiri ọṅụṅụ;unu ndị bi nʼala Tema,buterenụ ndị gbakwutere unu ọsọ ndụ nri.15Nʼihi na ọ bụ site nʼaghanke e ji mma agha egbu ndị mmadụ,na agha e ji akụ agbatu mmadụka ha si na-agbapụ ọsọ.16Nke a bụ ihe Onyenwe anyị sịrị m, “Tupu otu afọ agwụ, dị ka esi agụ afọ onye ohu e goro ọrụ, ịma mma Keda ga-agwụsị.17Ndị fọdụrụ ndụ nʼime ndị na-agba ụta, ndị bụ dike nʼagha na Keda, ga-adị mmadụ ole na ole.” Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel ekwuola ya.