Aịzaya19ibo_bib

Amụma e buru banyere Ijipt

1Nke a bụ amụma megide Ijipt:Lee, Onyenwe anyị na-abịa imegide Ijipt,ọ na-anọkwasịkwa nʼeluigwe ojii nke na-agba ọsọ.Arụsị ndị Ijipt niile na-ama jijiji nʼihu ya.Ọzọ, nʼihi ụjọ obi ndị Ijipt na-agbaze nʼime onwe ha.
2“Aga m akpali ndị Ijipt mee ka ha lụọ ọgụ nʼetiti onwe ha.Nwanne ga-emegide nwanne ya,onye agbataobi ga-emegidekwa onye agbataobi ya;obodo ga-emegide isi obodo;otu a kwa, alaeze ga-emegidekwa alaeze.3Ndị Ijipt ga-ada mba nʼime mmụọ ha,aga m eme ka nzube ha niile bụrụ ihe efu,ha ga-ajụta arụsị na mmụọ ndị nwụrụ anwụ ase,jụọkwa ndị na-ajụta mmụọ ọjọọ ase na ndị dibịa afa.4Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekwuola ya sị,Ọ bụ nʼaka eze afọ tara mmiri,nke na-adịghị eme ebere,ka m ga-enyefe ndị Ijipt, ka ọ bụrụ onye ga-achị ha.”
5Mmiri dị nʼosimiri ga-atada;ọ ga-atakwa takọrọkwa.6Ụzọ niile osimiri Ijipt ahụ si asọgharịga-atalata bido nʼisi isi.Ahịhịa riidi niile na amị niile ga-akpọnwụsịkwa.7Ahịhịa ndụ niile dị nʼakụkụ Naịl ga-akpọnwụ,ifufe ga-efesakwa ha.Mkpụrụ niile a kụrụ nʼebe ahụ ga-ala nʼiyi,ihe niile ga-anwụ.8Ndị ọkụ azụ ga-asụ ude, kwaa ụwa,na ndị niile na-atụba nko azụ nʼime Naịl,ndị na-agha ụgbụ nʼelu mmiriga-ata ahụ.9Ndị nʼarụ ọrụ flakisi etiri eti ga-eru ụjụ,na ndị na-akpa akwa ọcha ka olileanya ha ga-agharịpụ.10Obi ụtọ agaghị adịkwara ndị na-esite nʼịkpa akwa enweta ego,ha na ndị ọrụ dị iche iche a na-akwụ ụgwọ.
11Naanị ndị nzuzu ka ndịisi Zoan bụ,ndụmọdụ na-enweghị isi ka ndị na-adụ eze Ijipt ọdụ na-enye.Ị ga-esi aṅaa gwa Fero,“Abụ m otu nʼime ndị maara ihe,onye si nʼagbụrụ ndị eze ochie”?
12Ebee ka ndị ikom gị ahụ maara ihe nọ ugbu a?Ka ha gosi gị ma meekwa ka ị maara,ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niilezubere megide Ijipt.13Ndịisi obodo Zoan aghọọla ndị nzuzu,ndịisi obodo Memfis aghọkwaala ndị e duhiere eduhie;ndị bụ nkume isi nkuku nke ndị ya niileeduhiela ndị Ijipt ụzọ.14Onyenwe anyị awụnyela nʼime hammụọ nzuzu nke uche na-ezughị oke;nke mere ka Ijipt na-adagharị nʼihe niile ọ na-emedịka onye ṅụbigara mmanya oke si adagharị nʼihe ọ gbọrọ.15Ọ dịghị ihe Ijipt nwere ike ime,isi maọbụ ọdụ; alaka nkwụ maọbụ osisi achara.16Nʼụbọchị ahụ, ndị ikom Ijipt ga-adị ka ndị inyom, ha ga na-ama jijiji nʼegwu nʼihi aka ahụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile weliri elu imegide ha.17Ala Juda ga-ewetara ndị Ijipt oke egwu, oke ụjọ ga-atụ onye ọbụla akpọtaara aha Juda, nʼihi ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile na-ezube megide ha.18Nʼụbọchị ahụ, obodo ise nʼime ala Ijipt ga-asụ asụsụ Kenan, ṅụọ iyi irubere Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile isi. Otu nʼime obodo ndị a ka a ga-akpọ Obodo anwụ.19Nʼụbọchị ahụ, ebe ịchụrụ Onyenwe anyị aja ga-adị nʼetiti ala Ijipt.A ga-ewukwa otu ogidi ncheta nye Onyenwe anyị nʼoke ala ha.20Nke a ga-abụ ihe ama na ihe ngosi, na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọkwa nʼIjipt. Mgbe ha kpọkuru Onyenwe anyị maka ndị na-emegbu ha, ọ ga-aza ha, ọ ga-ezitere ha onye nzọpụta, onye ga-azọpụta ha.21Ya mere, Onyenwe anyị ga-eme ka ndị Ijipt mara onye ọ bụ, nʼụbọchị ahụ, ha ga-amata Onyenwe anyị, jirikwa ịchụ aja na onyinye fee ya. Ha ga-ekwe Onyenwe anyị nkwa debekwa ya.22Onyenwe anyị ga-eti Ijipt ihe otiti, ma ọ ga-agwọkwa ha. Ndị Ijipt ga-alọghachikwute Onyenwe anyị, ọ ga-aṅakwa ntị nʼarịrịọ ha gwọọkwa ha.23Nʼụbọchị ahụ, a ga-enwe okporoụzọ atụliri atụli nke ga-esite na Ijipt ruo Asịrịa. Ndị Asịrịa ga-aga Ijipt, ndị Ijipt ga-agakwa Asịrịa, ndị Ijipt na ndị Asịrịa ga-eso fee ofufe.24Nʼụbọchị ahụ ka Izrel ga-abụ nke atọ imezu Ijipt na Asịrịa, bụrụ ngọzị nʼụwa.25Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-agọzi ha, na-asị, “Ka ngọzị dịrị Ijipt, ndị m, dịrị Asịrịa nke bụ akaọrụ m, na Izrel ihe nketa nke m.”