1Ahụhụ ga-adịrị ala ahụ a na-anụ ụzụ ọtụtụ nku nʼime ya,ala ahụ dị nʼofe iyi ukwu niile nke Kush.2Ala nke na-ezipụ ndị ozi ya site nʼosimiri,bụ ndị na-eji ụgbọ mmiri papịrọs nʼaga nʼelu mmiri.Gaanụ ngwangwa, unu ndị ozi dị nkọgakwuru ndị toro ogologo nke ahụ ha na-akwọ mụrụmụrụ,gakwuru ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,mba na-achọ okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa,ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.3Unu niile bi nʼelu ụwa dum,na unu ndị nwere ebe obibi nʼụwa, geenụ m ntị.Mgbe e buliri ọkọlọtọ elu nʼelu ugwu niile,lee anya;mgbe a fụrụ opi ike,gee ntị.4Nʼihi na ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị gwara m,“Aga m anọ jụụ na-elepụ anya site nʼebe obibi m,dịka mgbe igirigi na-ada nʼoge okpomọkụ nke owuwe ihe ubi,na dịka anyanwụ si acha nʼoge okpomọkụ.”5Nʼihi na tupu oge owuwe ihe ubi eruo, mgbe ifuru dapụsịrị,mgbe okoko na-aghọ mkpụrụ vaịnị nke ka na-achata achata,ọ ga-eji mma oge gbuchapụ ụmụ alaka ya,ọ ga-egbutu ma wezugakwa alaka ndị ahụ na-awasa awasa.6A ga-ahapụ ozu ndị agha haka anụ ufe nke ugwu na ụmụ anụ ọhịa rie ha.Ụmụ nnụnụ ga-eri anụ ha nʼoge okpomọkụ,ma ụmụ anụ ọhịa ga-eri ha nʼoge oyi.7Ma mgbe ahụ, a ga-ewetara Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile onyinye dị iche iche,site na ndị toro ogologo, ndị ahụ na-akwọ mụrụmụrụ,site na ndị a na-atụ egwu nʼebe niile,bụ mba ndị okwu na ụka, nke na-azọpịakwa azọpịa,ndị osimiri dị iche iche kewara ala ha.A ga-eweta onyinyea nʼUgwu Zayọn, nʼebe ahụ a na-akpọku aha Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.