Aịzaya16ibo_bib
1Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinyenye onye na-achị ala ahụsite na Sela, gafee nʼụzọ ọzararuo ugwu nke Ada Zayọn.2Ndị inyom Moabnọkwa nʼọnụ mmiri Anọnna-akwụgharịdịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.3Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,”“Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri.Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalịnʼetiti oke ehihie.Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ,ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu,ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.”Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ,mbibi ga-akwụsịkwa,onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.5A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya;otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi,otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid,bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi,na-emekwa ngwa ime ezi omume.6Anyị anụla akụkọ banyere Moab,nụkwa ihe banyere nganga ya na aghụghọ ya niile.Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi?Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.7Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa,ha na-ebetara Moab akwa.Kwasie akwa ike, nwee mwute,nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu;osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala.E, ndị eze mba dị iche iche azọdalaọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ.E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza,ruokwa nʼọzara,nke mgbọrọgwụ ha gbasararuo nʼọnụ osimiri.9Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza si akwa akwanʼihi ubi vaịnị Sibma.Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụgị Heshbọn, na gị Eleale,nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-adamgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.10Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma,ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige;ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya;nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.11Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara,ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.12Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu,ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya,mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya,o nweghị uru nke a ga-abara ha.13Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ,14ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụsi agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”