1Amụma megide Moab:Ar dị na Moab a laala nʼiyi,a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.Kia dị na Moab a laala nʼiyi,a lara ya nʼiyi naanị nʼotu abalị.2Ndị niile bi na Dibọnna-aga nʼihu ụlọ mmụọ ha ịkwa akwa. NdịMoab na-akwa akwa nʼihi Nebo na Medeba.Isi ha niile bụ isi nkwọcha,afụọnụ ha niile ka akpụchakwara.3Ha na-eyi akwa mkpe na-agagharị nʼezi,mkpu akwa na-ada nʼelu ụlọ, na nʼama.Ha niile ji iti mkpu na ịkwa akwana-ada nʼala.4Heshbọn na Eleale na-eti mkpu akwa,a na-anụ olu akwa ha ọ bụladị ruo Jehaz.Nʼihi nke a, ndị agha Moab na-eti mkpu akwa,mkpụrụobi ha na-amakwa jijiji.5Ọ na-ewute mkpụrụobi m nʼihi Moab,ndị ya na-agba ọsọ ruo ọ bụladị nʼobodo Zoana Eglat Shelishiya.Ha na-akwa akwadịka ha na-arịgo Luhit.Mgbe ha na-agbago ụzọ Heronaim,ha na-ebe akwa mwute nʼihi mbibi bịakwasịrị ha.6Mmiri Nimrim atachaala!Ahịhịa akpọnwụọkwala;ahịhịa ndụ niile agwụkwalao nwekwaghị akwụkwọ ndụ nke fọrọ.7Ya mere akụnụba ha kpakọbara ndị ha chekwaraka ha buuru gafee ofe ndagwurugwu warawara nke ọdọ mmiri osisi pọpla niile.8Mkpu akwa ha na-ada ụda gburugburu oke ala Moab niile;akwa ha na-ebesi ike na-ada ruo obodo Eglaim;abụ akwa ha na-erukwa Bịa-Elim.9Iyi Dibọn jupụtara nʼọbara,ma aga m atụkwasịkwa ọ bụladị ọtụtụ ihe ndị ọzọ nʼelu Dibọn!Ọdụm ka a ga-atụkwasịrị ndị Moab gbapụrụtụkwasịkwara ndị fọdụrụ nʼala ahụ.