Aịzaya12ibo_bib

Abụ Otuto

1Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwu sị,“Aga m eto gị Onyenwe anyị.Ọ bụ ezie na ị wesara m iwe,ma ugbu a, iwe gị adajụọla;ị kasịkwara m obi.2Nʼezie, Chineke bụ onye nzọpụta m;aga m atụkwasị ya obi, ụjọ agaghị atụkwa m.Onyenwe anyị, Onyenwe anyị ya onwe ya, bụ ike m bụrụkwa abụ m,ọ ghọrọla m onye nzọpụta.”3Ị ga-eji ọṅụ dọrọ mmirisite nʼolulu mmiri nke nzọpụta.4Nʼụbọchị ahụ, ị ga-ekwukwa sị,“Nyenụ Onyenwe anyị otuto, Kwupụtakwa aha ya ;meenụ ka amata nʼetiti mba niile ihe niile ọ rụrụ ;kwusaanụ na aha ya bu ihe e buliri elu.5Bụkuonụ Onyenwe anyị abụ, nʼihi na o meela oke ihe dị ebube.Meekwanụ ka ụwa niile mara ihe ọ rụrụ.6Ka ndị niile bi na Zayọn tie mkpu ọṅụ, bụkwaa abụ.Nʼihi na Onye nsọ nke Izrel. dị ukwuu, e, ọ dị ike nke ukwuu, bụ Onye ahụ na-ebi nʼetiti unu.”