Aịzaya10ibo_bib
1Ahụhụ na-adịrị ndị niile na-atụpụta iwu na-ezighị ezi;ndị niile na-atụpụta iwu mmegbu,2iji napụ ndị ogbenye ihe ruru hanakwa ịnapụ ndị m a na-emegbu emegbu ikpe ziri ezi,na-emekwa ka ụmụ nwanyị di ha nwụrụ bụrụ anụ oriri hana izunara ụmụ na-enweghị nne na nna ihe ha nwere.3Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-abịa ileta unu?Gịnị ka unu ga-eme nʼụbọchị m ga-eweta ịla nʼiyi, nke ga-esi nʼebe dị anya bịara unu?Onye ka unu ga-agbakwuru maka enyemaka?Ọ bụ ebe ka unu ga-ahapụ akụ unu niile?4Mba, ọ dịghị ihe ga-afọdụ; karịa na a ga-egbu unu nʼihu ọgụ,maọbụ dọkpụrụ unu dịka ndị mkpọrọ.Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ,aka ya ka setịpụkwara esetipụ.