Hosiya7ibo_bib
1mgbe m chọrọ ịgwọ Izrel,mmehie Ifrem na-apụta ihe,a na-ekpughekwa arụ a na-eme na Sameria.Ha na-aghọ aghụghọ,ndị ohi na-akụwakwa ụlọ ndị mmadụ,ndị na-apụnara mmadụ ihe nọ nʼokporoụzọ.2Ọ dịghị onye bi nʼime ha maarana m na-echeta mmehie ha niile.Ugbu a, mmehie ha agbaala ha gburugburu.Ana m ahụkwa ha niile.3“Eze ha na-aṅụrị ọṅụ nʼihe ọjọọ ha;ụmụ eze na-achị ọchị nʼihi ụgha ha.4Ha niile bụ ndị na-akwa iko;ha dị ka ite ọkụ ighe achịcha e mere ka ọ dị ọkụ,nke onye na-eghe achịcha na-adịghị akwanye nkụ,site na mgbe e bidoro ịgwakọ ụtụ ọka ahụ tutu ruo mgbe o koliri.5Nʼụbọchị mmemme nke eze anyị,ụmụ eze bụ ndị akpalịrị site na-ịṅụbiga mmanya oke,ya na ndị na-akwa emo jikọtara aka.6Obi ha na-enwu ọkụ dịka ihe ighe achịcha,ha ji izu nzuzo na-abịakwute ya.Nʼabalị niile iwe ha na-ere nwayọọ ka ọkụ na-anyụ anyụ,nʼụtụtụ ihe ha gbatara nʼizu na-enwu dịka ọkụ.7Ha niile dị ọkụ dịka ite ighe achịcha dị ọkụ.Ha na-eripịa ndị eze ha.Ndị eze ha niile na-ada,ma o nweghị onye nʼime ha na-akpọku m.8“Ifrem na-agwakọta onwe ya nʼetiti ndị mba ọzọ.Ifrem dịkwa ka mbadamba achịcha a na-atụgharịghị atụgharị.9Ndị mba ọzọ na-eripịa ike ha,ma ha adịghị aghọta ya.Isi awọ apụtala ha nʼisi,ma ya onwe ya amaghị na o si otu a dịrị.10Ịnya isi Izrel na-agba akaebe megide yama nʼagbanyeghị ihe ndị aọ naghị alọghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke ya,maọbụ chọọ ya.11“Ifrem dịka ndurunke na-enweghị uche, nke onye ọbụla na-eduhie,ugbu a, ọ na-akpọku Ijipt,ma na-agbakwurukwa Asịrịa.12Ma mgbe ha na-agbagharị, aga m ewere ụgbụ m jide ha,dọda ha nʼala dịka nnụnụ e jidere na mbara eluigwe.Aga m enye ha ahụhụnʼihi njehie ha niile.13Ahụhụ na-adịrị ha,nʼihi na ha ajụla m.Ha na-ala nʼiyinʼihi na ha enupula isi ha megide m.Achọrọ m ka m gbapụta ha,ma ha na-agha ụgha megide m.14Ha ejighịkwa obi ha akpọku m,kama ha na-atụrụ onwe ha nʼelu ihe ndina ha, na-eti mkpu akwa.Mgbe ha na-arịọ arịrịọ maka mkpụrụ ubi na mmanya,ha na-egbukasị onwe ha ahụ,na-ewezugakwa onwe ha site nʼebe m nọ.15Enyerela m ha aka, mee ka ha dị ike,ma ha atụgharịala gbaa izu imegide m.16Ha adịghị ele anya enyemaka nʼaka Onye kachasị ihe niile elu.Ha dịka ụta rọgọrọ arọgọ, nke àkụ ya na-adịghị agbata ihe ọbụla.Ndị ndu ha ga-ada site na mma agha,nʼihi okwu ọjọọ si ha nʼọnụ na-apụta.Nʼihi nke a, a ga-eji ha mee ihe ọchịnʼala Ijipt.