1“Bịanụ ka anyị laghachikwuru Onyenwe anyị.Ya onwe ya adọkaala anyị,ọ ga-agwọkwa anyị;o tipụla anyị ọnya,ma ọ ga ekechikwa ọnya anyị.2Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ ọzọ mgbe ụbọchị abụọ gasịrị.Nʼụbọchị nke atọ, ọ ga-eme ka anyị bilie guzokwa nʼụkwụ anyị,meekwa ka anyị dịrị ndụ nʼihu ya.3Ka anyị mara Onyenwe anyị;ka anyị gbalịsie ike ịmata ya.Ọ bụladị dịka anyanwụ na-awalite,nʼezie, ọ ga-apụta ìhè dịka chi ọbụbọ,ọ ga-abịakwute anyị dịka mmiri ozuzo,dịka mmiri na-ezosa ala nʼoge udu mmiri.”4“Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Ifrem?Gịnị ka m ga-eji gị mee, O Juda?Ịhụnanya gị dịka igwe ojii nke ụtụtụ,dịka igirigi na-anọ naanị nwa mgbe nta.5Nke mere m ji si nʼọnụ ndị amụma gbukasịa ha.Ejirila m okwu ọnụ m gbuo ha,ikpe ọmụma m na-achawapụta dịka ìhè.6Nʼihi na ana m achọ ebere, ọ bụghị aja,ịmata Chineke kama aja nsure ọkụ niile.7Ma dịka Adam, ha emebiela ọgbụgba ndụ m;nʼebe ahụ ka ha nọ gosi ekwesighị ntụkwasị obi ha.8Gilead bụ obodo nke ndị na-eme ajọ ihe,nke eji nzọ ụkwụ ọbara zọtọsịa.9Dịka ndị na-apụnara mmadụ ihe na-ezo na-eche onye ga-agafe,otu a ka ndị nchụajasi egbu ndị mmadụ nʼụzọ Shekem,leenụ oke ajọ omume ihere dị otu a.10Nʼezie, ahụla m ihe jọgburu onwe ya nʼime Izrel.Nʼebe ahụ ka Ifrem nọ na-agba akwụna,emerụọkwala Izrel.11“Ma nye gị onwe gị, Juda,owuwe ihe ubi nọ na-eche gị.“Mgbe ọbụla m ga-eweghachi akụnụba ndị m,