1“Mgbe Izrel bụ nwantakịrị, ahụrụ m ya nʼanya,ọ bụkwa site nʼIjipt ka m kpọpụtara nwa m.2Ma dịka m na-akpọ ha,otu a ka ha na-aga nʼebe dị anya site nʼebe m nọ.Ha chụrụ Baal aja,surekwa aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye arụsị dị iche iche.3Ọ bụ mụ onwe m kuziiri Ifrem otu e si aga ije,ejidere m ha nʼaka m abụọ,ma ha amaghịna ọ bụ mụ onwe m gwọrọ ya.4Eji m ụdọ nke mmadụ bụ ebere,na ịhụnanya duo ya.Adịrị m ha dịka onye nʼebuliibu arọ site nʼolu ha,ehulatakwara m ala, were aka m tinye ha nri nʼọnụ.5“Ọ bụ na ha agaghị alaghachi azụ nʼIjipt,Asịrịa ọ gaghị abụ eze ha,nʼihi na ha ajụla ịlọghachikwute m?6Mma agha ga-efegharị nʼobodo ha niile,ọ ga-eripịa ndị nchụaja na-agba afa,ọ ga-eripịakwa nzube ọjọọ ha niile.7Ndị m ekpebiela nʼobi ha ịhapụ m.Nʼagbanyeghị na ha na-akpọ m Chineke nke kachasị ihe niile elu,ma mụ onwe m agaghị ebuli ha elu nʼụzọ ọbụla.8“M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Ifrem?M ga-esi aṅaa rara gị nye, gị Izrel?M ga-esi aṅaa mee gị ka ịdị ka Adma?M ga-esi aṅaa meso gị dịka Zeboiim?Obi m na-akwasị akwa ike nʼime m;ọ na-agụsị m agụụ ike inyere unu aka.9Agaghị m emezu iwe ọkụ mmaọbụ bibiekwa Ifrem ọzọ.Nʼihi na abụ m Chineke, abụghị m mmadụ.Abụ m Onye Nsọ na-ebi nʼetiti unu.Agaghị m emegidekwa obodo ha.10Nʼihi na ha ga-agbaso Onyenwe anyị.Ọ ga-agbọkwa ụja dịka ọdụm.Mgbe ọ gbọrọ ụja,ụmụ ya ga-eji ịma jijiji site nʼakụkụ ọdịda anyanwụ bịakwute ya.11Dịka igwe nnụnụka ha ga-ama jijiji bịa site nʼIjipt,dịka nduru ka ha ga-efelata site nʼAsịrịa.Aga m eme ka ha biri nʼụlọ ha ọzọ,”otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Mmehie Izrel
12Ifrem e jirila okwu ụgha gbaa m gburugburu,ezinaụlọ Izrel e jirila aghụghọ na-emeso m omume,ma Juda nọsịrị ike nʼekweghị nchịkọta nʼebe Chineke nọ,ọbụladị megide Onye Nsọ ahụ nke kwesiri ntụkwasị obi.