Habakuk1ibo_bib

1Nke a bụ ozi Habakuk onye amụma natara.

Mkpesa Habakuk

2Onyenwe anyị, ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-eti mkpuma ị dịghị ege ntị?Ruo ole mgbe ka m ga na-etiku gị na-asị, “Ihe ike, ihe ike!”ma ị dịghị azọpụta?3Nʼihi gịnị ka i ji eme m ka m na-ahụ ihe ọjọọ?Gịnị mere i ji anagide mmegbu?Mbibi na ihe ike dị nʼihu m,na ịlụ ọgụ, na esemokwu jupụtakwara ebe niile.4Nʼihi ya, iwu na-ada mba,ikpe ziri ezi adịghị agakwa nʼihu.Ndị ajọ mmadụ na-agba ndị ezi omume gburugburu,nke mere ka ikpe ziri ezi ghọọ ihe gbagọrọ agbagọ.

Ọsịsa Onyenwe anyị

5“Legide mba niile anya, ka i hụ.Lee, ka o ju gị anya nke ukwuu.Nʼihi na agaje m ime ihe nʼụbọchị ndụ unu,nke unu na-agaghị ekwenye,ọ bụladị ma akọọrọ unu ya.6Nʼihi na lee, agaje m ime ka ndị Kaldịa bilie,bụ mba ahụ na-adịghị eme ebere, na ndị na-eme ngwangwa.Ha bụ ndị na-ebu agha na-ejegharị na mba niile,ndị na-esite nʼaka ike na-enweta ebe obibi nke na-abụghị nke ha.7Ha bụ mba a na-atụ ụjọ, na ndị dịkwa egwu.Ha bụ iwu nye onwe ha, ihe ha tụpụtara ka ha na-eme.Ọ bụ onwe ha ka ha na-ebuli elu.8Ịnyịnya ha nwere ụkwụ nkọ karịa agụ.Ha na-akpa ike karịa nkịta ọhịa nke na-ejegharị nʼanyasị.Ndị ịnyịnya agha ha na-awụ ọsọ,ndị ha na-agba ịnyịnya na-esitekwa ebe dị anya na-abịa.Dịka ugo nke na-efedata i buru nri ọ ga-eri.9Ha niile na-abịa ime ihe ike.Ha ji ọsọ na-abịa dịka oke ifufe nke ọzara.Ha na-abịa ịchịkọta ndị a dọtara nʼagha dịka ha bụ uzuzu.10Ha na-akwa ndị eze emo,jirikwa ndịisi ọchịchị na-eme ihe ọchị.Ha na-achị ebe niile e wusiri ike ọchị,na-ekpokọtakwa aja nʼazụ mgbidi niile ịlụta ha nʼagha.11Mgbe ahụ, ha na-esi nʼebe ahụ gabiga dịka ifufe, na-agabigakwandị mehierenụ, bụrụkwa ndị ikpe mara, ndị ike ha bụ chi ha.”

Mkpesa Habakuk nke ugboro abụọ

12Onyenwe anyị, Ọ bụ na ị dịghị site mgbe niile ebighị ebi?Chineke m, na Onye Nsọ m, Ị gaghị anwụ.Gị, Onyenwe anyị, họpụtara ha maka ikpe ikpe.Gị, oke nkume m, emeela ka ha bụrụ ndị ga-enweta ahụhụ.13Ma anya gị dị ọcha nke ukwuu, na ọ dịghị elekwasị ajọ ihe anya;ị naghị anabatakwa mmegbu.Ma gịnị mere i ji gba ndị aghụghọ nkịtị?Gịnị mere i ji gba nkịtị mgbe ndị ajọ omume na-elodandị bụ ndị ezi omume karịa ha?14I meela ndị mmadụ ka ha dịrị ka azụ nke osimiri,e, dịka anụ na-akpụ akpụ nke oke osimiri, nke na-enweghị onye na-achị ha.15Onye iro nke ajọ omume juru obi, na-eji nko ya na-egbu ha.Ọ na-ejikwa nko ụgbụ ya na-ejide ha.Ọ na-achịkọta ha nʼụgbụ ya,si otu a na-aṅụrị ọṅụ, ma na-etegharịkwa egwu ọṅụ.16Nʼihi nke a, ọ na-achụ ajana-esurekwa ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye ụgbụ ya,nʼihi na ọ bụ ụgbụ ya na-eme ka ọ na-ebi ezi ndụ,na-erikwa nri kachasị mma17Ọ ga-aga nʼihu mgbe niile na-awụpụ ihe o ji ụgbụ ya gbutena-ala mba niile nʼiyi, dịka o si masị ya, na-egosighị obi ebere ọbụla?