Jenesis5ibo_bib

Site nʼAdam ruo Noa

1Nke a bụ usoro ihe ndepụta banyere agbụrụ Adam.
Mgbe Chineke kere mmadụ, o kere ya nʼoyiyi Chineke.
2O kere ha nwoke na nwanyị, gọziekwa ha. Mgbe e kere ha, ọ kpọrọ ha mmadụ.
3Mgbe Adam gbara narị afọ na iri afọ atọ, ọ mụrụ nwa ya nwoke nʼoyiyi nke ya, na nʼụdịdị nke ya. Ọ gụrụ ya Set.4Site nʼoge a mụrụ Set, Adam dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ, ọ mụrụ ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.5Adam nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ atọ.6Set gbara narị afọ na ise mgbe ọ ghọrọ nna Enọsh,7Mgbe ọ ghọchara nna Enọsh, Set dịrị ndụ ruo narị afọ asatọ na asaa ọzọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.8Set nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ na abụọ.9Mgbe Enọsh gbara iri afọ itoolu, ọ ghọrọ nna Kenan.10Mgbe ọ ghọchara nna Kenan, Enọsh dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ na ise, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.11Enọsh nwụkwara mgbe ọ nọzuru narị afọ itoolu na afọ ise.12Mgbe Kenan gbara iri afọ asaa ka ọ ghọrọ nna Mahalalel.13Mgbe ọ ghọchara nna Mahalalel, Kenan dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ anọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.14Kenan nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na afọ iri.15Mgbe Mahalalel gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Jared.16Mgbe ọ ghọchara nna Jared, Mahalalel dịrị ndụ narị afọ asatọ na iri afọ atọ, mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.17Mahalalel nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asatọ na iri afọ itoolu na ise.18Mgbe Jared dị narị afọ na iri afọ isii na abụọ ka ọ ghọrọ nna Enọk.19Mgbe ọ ghọchara nna Enọk, Jared dịrị ndụ narị afọ asatọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.20Jared nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na abụọ.21Mgbe Enọk gbara iri afọ isii na afọ ise ka ọ ghọrọ nna Metusela.22Mgbe ọ ghọchara nna Metusela, Enọk soro ụzọ Chineke narị afọ atọ. Nʼoge a, ọ mụtara ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.23Ọnụọgụgụ nke afọ niile Enọk biri ndụ, bụ narị afọ atọ na iri afọ isii na ise.24Enọk soro ụzọ Chineke ruo na a hụkwaghị ya nʼihi na Chineke kpọọrọ ya.25Mgbe Metusela gbara narị afọ na iri afọ asatọ na asaa ka ọ ghọrọ nna Lamek.26Mgbe ọ ghọchara nna Lamek, Metusela dịrị ndụ narị afọ asaa na iri afọ asatọ na abụọ ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.27Metusela nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ itoolu na iri afọ isii na itoolu.28Mgbe Lamek gbara narị afọ na iri afọ asatọ na abụọ ka ọ mụtara nwa nwoke.29Lamek gụrụ ya Noa, nʼihi na ọ sịrị: “Ọ ga-akasị anyị obi nʼime oke ọrụ na ndọgbu anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ nʼala a Onyenwe anyị bụrụ ọnụ.”30Mgbe a mụsịrị Noa, Lamek dịrị ndụ narị afọ ise na iri afọ itoolu na ise ọzọ mụta ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom.31Lamek nwụrụ mgbe ọ gbara narị afọ asaa na iri afọ asaa na asaa.32Mgbe Noa gbara narị afọ ise ọ ghọrọ nna Shem, Ham na Jafet.