Jenesis27ibo_bib
1Mgbe Aịzik ghọrọ agadi, nʼoge anya ya na-adịghị ahụzi ụzọ nke ọma, ọ kpọrọ Ịsọ ọkpara ya, sị ya, “Nwa m nwoke.” Ọ zara sị, “Lee m nʼebe a.”2Aịzik gwara ya sị, “Ugbu a, emeela m agadi, amakwaghị m ụbọchị ọnwụ m.3Ya mere, were ihe ịchụ nta gị, ụta gị na àkụ gị, gaa nʼọhịa, gbutere m anụ.4Siere m nri ụtọ otu ahụ o si amasị m, butere m ya ka m rie, ka mụ onwe m gọzie gị tupu m nwụọ.”5Ma Ribeka nọ na-ege ntị mgbe Aịzik na-agwa nwa ya Ịsọ okwu. Nke mere na mgbe Ịsọ gawara nʼọhịa ịchụ nta,6Ribeka gwara Jekọb nwa ya okwu sị ya, “Lee, anụrụ m ka nna gị na-agwa nwanne gị Ịsọ okwu sị ya,7‘Gaa nʼọhịa gbute anụ, siere m nri ụtọ, ka m nọdụ nʼihu Onyenwe anyị nye gị ngọzị ikpeazụ tupu m nwụọ.’8Ugbu a, nwa m nwoke, gee ntị nke ọma, mee ihe niile m gwara gị.9Gaa ugbu a nʼigwe anụ ụlọ wetara m ụmụ nwa ewu abụọ dị mma ka m jiri ha siere nna gị nri dị ụtọ, ụdị ahụ na-amasị ya.10Ị ga-eburu ya bujere nna gị ka o rie, ka ya onwe ya gọzie gị tupu ọ nwụọ.”11Ma Jekọb gwara Ribeka nne ya okwu sị ya, “Nwanne m nwoke Ịsọ bụ onye gbara ajị. Ahụ nke m na-akwọ mụrụmụrụ.12Gịnị ga-eme ma nna m metụ m aka nʼahụ? Nʼihi ya, aga m abụ onye na-aghọ ya aghụghọ, aga m esi otu a wetara onwe m ịbụ ọnụ kama ngọzị.”13Nne ya gwara ya sị, “Nwa m nwoke ka ọbụbụ ọnụ gị dakwasị m. Naanị mee ihe m kwuru. Gaa wetara m ha.”14Ya mere, ọ gara weta ha nye nne ya. O ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya.15Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb.16O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ.17O bunyere nwa ya nwoke Jekọb nri ahụ na-atọ ụtọ, na achịcha o mere.18O jekwuuru nna ya sị ya, “Nna m.” Ọ zara sị, “Ahaa, nwa m, onye ka ị bụ?”19Jekọb zara nna ya sị ya, “Abụ m Ịsọ, ọkpara gị. Emeela m ihe ị sị m mee. Biko bilie ka i rie anụ m gbutere nʼọhịa, ka gị onwe gị gọzie m.”20Ma Aịzik jụrụ nwa ya nwoke sị, “Olee otu i si chọta ya ngwangwa, nwa m?” Jekọb zara ya sị, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị mere ka ihe gaara m nke ọma.”21Mgbe ahụ Aịzik gwara Jekọb sị, “Bịa nso ka m metụ gị aka nwa m nwoke, ka m mata ma ị bụ Ịsọ nʼeziokwu.”22Jekọb jere nna ya Aịzik nso, onye metụrụ ya aka kwuo sị, “Olu bụ olu Jekọb ma aka gị bụ aka Ịsọ.”23Ọ chọpụtaghị na ọ bụ Jekọb, nʼihi na aka ya dị ajị ajị dịka nke Ịsọ. Ya mere, ọ gọziri ya.24Ma ọ jụkwara ya ajụjụ ọzọ sị ya, “Ị bụ nwa m nwoke Ịsọ nʼeziokwu?” Jekọb zara sị ya, “E, abụ m ya.”25Mgbe ahụ, Aịzik zara sị ya, “Butere m ụfọdụ nʼime anụ ahụ i gbutere ka m rie, nye gị ngọzị m.” Jekọb butere ya bunye ya. O riri ya.26Mgbe ahụ, nna ya Aịzik sịrị ya, “Bịa nʼebe a nwa m nwoke, sutu m ọnụ.”27Ya mere, o jekwuuru ya sutu ya ọnụ. Mgbe Aịzik nụrụ isisi uwe ya, ọ gọziri ya, sị,“Nʼezie, isisi nwa m nwokedịka isisi ala ubinke Onyenwe anyị gọziri.28Ka Chineke nye gị site nʼigirigi nke eluigwe,na mmanụ nke ala,ụba nke mkpụrụ ubi na mmanya ọhụrụ29Ka ọtụtụ mba jeere gị ozi,ka ndị mmadụ kpọọ isiala nye gị.Bụrụ onye ọchịchị nʼebe ụmụnna gị nọ,ka ụmụ nne gị mụrụ kpọọ isiala nye gị.Ka ndị niile na-abụ gị ọnụ bụrụ ndị a bụrụ ọnụ,ka ndị na-agọzi gị bụrụ ndị a gọziri agọzi.”