Ndị Galeshịa1ibo_bib
1Pọl, onyeozi, na-abụghị site na nhọpụta nke mmadụ maọbụ site nʼike nke mmadụ, kama ọ bụ site nʼaka Jisọs Kraịst na Chineke Nna, onye mere ka ọ site nʼọnwụ bilie.2Ndị ụmụnna niile ndị mụ na ha nọ nʼebe a,
Na-edegaranzukọ niile dị na Galeshịa.3Ka amara na udo nke sitere na Chineke Nna anyị, na Onyenwe anyị Jisọs Kraịst dịrị unu.4Onye nyere onwe ya nʼihi mmehie anyị niile dị ka nzube Chineke bụ Nna anyị si dị, ịzọpụta anyị site nʼoge ọjọọ a nke anyị bi nʼime ya.5Onye otuto dịịrị ruo mgbe niile ebighị ebi. Amen.