Izikiel28ibo_bib

Amụma megide eze Taịa

1Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,2“Nwa nke mmadụ, gwa eze Taịa, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị:“ ‘Nʼihi nganga nke juru gị obi,ị na-ekwu sị, “Mụ onwe m bụ chi,mụ onwe m na-anọkwasị nʼocheeze nke otu chi,nke dị nʼetiti oke osimiri niile.”Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,ọ bụ ezie na ị na-eche na ị mara ihe dịka chi.3Ị maara ihe karịa Daniel?Ọ bụ na o nweghị ihe e zoro ezo nʼebe ị nọ?4I werela amamihe gị na nghọta gịnwetara onwe gị akụ,tụkọba ọlaedo na ọlaọcha,nʼime ụlọakụ gị dị iche iche.5E, mmụta nʼịzụ ahịa gịemeela ka ị ghọọ ọgaranya,nʼihi akụnụba inwereị bụrụla onye na-akpa nganga.6“ ‘Ya mere, nke a bụ ihe Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-ekwu;“ ‘ebe ọ bụ na ị gụrụ onwe gị dịka onye maara iheonye maara ihe dịka chi,7ana m aga ịkpọbata ndị mba ọzọ megide gị,bụ mba kachasị mba niile dị iche iche njọ na-enweghị obi ebere.Ha ga-amịpụta mma agha ha megide ịma mma gị na amamihe gị,ha ga-adụwakwa ebube nke mma gị.8Ha ga-eme ka ị rịdaruo nʼolulu nke ala mmụọ.Ị ga-anwụ ọnwụ ikenʼetiti oke osimiri niile.9Mgbe nke a mere, ị ga-asị, “Mụ onwe m bụ chi,”nʼihu ndị ahụ na-egbu gị?Ma gị onwe gị bụ mmadụ efu, ị bụghị chi,nʼaka ndị ahụ na-egbu gị.10Ị ga-anwụ ọnwụ dịka ndị a na-ebighị ugwu,site nʼaka ndị ọbịa.Mụ onwe m ekwuola, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’ ”
11Okwu nke Onyenwe anyị rutere m ntị, sị,12“Nwa nke mmadụ, bulie abụ akwa banyere eze Taịa ma gwa ya, ‘Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,“ ‘Gị onwe gị bụ akara izuoke,ị jupụtara na amamihe na ịma mma.13Ị nọ nʼIden,nʼubi Chineke a gbara ogige.Nʼebe ahụ ka e ji nkume dị oke ọnụahịa ndị a chọọ gị mma,rubi, na topaazi, na emeralụdụ,na krisolaịt, na ọniks, na jaspa,na safaia, na tọkwọisi, na beril.A rụnyere nkume ndị a niile nʼime ọlaedo.Ọ bụkwa nʼụbọchị ahụ e kere gị ka e doziri ha.14Ahọpụtara m gị mee gị ka ị bụrụ cherub,ọrụ ahụ e doro gị iche ịrụ.Ọ bụ nʼugwu nsọ Chineke ka ị na-anọ,na-ejegharịkwa nʼetiti nkume ndị ahụ na-acha ọkụ.15Ị bụ onye na-enweghị ịta ụtanʼụzọ gị niile site nʼụbọchị e kere gị,tutu ruo mgbe a hụrụ ajọ omume nʼime gị.16Site nʼịba ụba nke ọzụzụ ahịa gịị ghọrọ onye na-eme ihe ike,si otu a mehiekwa.Nʼihi ya, esi m nʼugwu Chineke chụpụ gị, nʼihi adịghị nsọ gị.Esitekwara m nʼetiti nkume ọkụ ndị ahụ chụpụ gị,gị cherub na-ekpuchi ekpuchi.17Obi gị jupụtara na nganganʼihi ịma mma gị,i mere ka amamihe gịbụrụ ihe rụrụ arụ nʼihi ebube nke ịma mma gị.Nʼihi ya, achụdara m gị, tụọ gị nʼala,mee ka ị bụrụ ihe nlere anya nye ndị eze niile.18Nʼihi ọtụtụ mmehie gị, na ịzụ ahịa aghụghọ gị,i meela ka ụlọnsọ gị niile ghọọ ihe rụrụ arụ.Nʼihi ya, emere m ka ọkụ si nʼetiti gị pụta,repịa gị.Ka ị ghọọ ntụ nʼelu ala,nʼihu ndị ahụ niile na-ele gị anya.19Ndị niile maara gịka ihe ndị a juru anya,nʼihi na ị ghọọla ihe oke egwu.Ị laala nʼiyi ruo ebighị ebi.’ ”

Amụma megide Saịdọn

20Okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,21“Nwa nke mmadụ, chee ihu nʼebe Saịdọn dị buo amụma megide ya,22ma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru,“ ‘Mụ onwe m na-emegide gị, gị Saịdọn,nʼetiti unu ka m ga-egosipụta otuto m.Unu ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyịmgbe m mere ka ahụhụ dakwasị unu,nʼime unu, a ga-anwapụta na m bụ onye dị nsọ.23Aga m ezite ajọ ọrịa na-efe efe, nke ga-emegide ya,meekwa ka ọbara jupụta nʼokporoụzọ ya niile.Ndị e gburu egbu ga-ada nʼime ya,site na mma agha nke ga-abịakwasị ya nʼakụkụ niile.Mgbe ahụ, ha ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị.24“ ‘Ụlọ Izrel agaghị enwekwa mba kpọrọ ha asị gbara ha gburugburu ndị dịka uke, nke na-adụ adụ, na ogwu nke na-egbu mgbu. Ha ga-amatakwa na mụ onwe m bụ Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị.25“ ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru: Ndị Izrel ga-alọghachi biri nʼala nke aka ha ọzọ, ala nke m nyere nna ha Jekọb ohu m. Nʼihi na aga m esite na mba niile ha gbasasịrị chịkọtaa ha, si otu a gosi mba niile nke ụwa ịdị nsọ m.26Ha ga-ebi nʼala a na ntụkwasị obi. Ha ga-ewu ụlọ, kụọ ubi vaịnị, birikwa na-atụghị egwu ọbụla. Mgbe m pịachara mba niile dị ha gburugburu ụtarị, bụ mba ndị ahụ mekpara ha ahụ, mgbe ahụ, ha ga-amata nʼezie na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha.’ ”