Izikiel21ibo_bib

Babilọn, mma agha Chineke

1Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,2“Nwa nke mmadụ, chee ihu gị nʼụzọ Jerusalem, buo amụma megide ụlọnsọ ukwu ahụ. Bukwaa amụma megide ala Izrel3sị ala Izrel otu a, ‘Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, Mụ onwe m na-emegide gị. Aga m esite nʼọbọ mịpụta mma agha m, site na gị gbuchapụ ma onye ezi omume na onye ajọ omume.4Nʼihi na m na-aga igbuchapụ ndị ezi omume na ndị ajọ omume, mma agha m ga-esite nʼọbọ ya pụta megide onye ọbụla site nʼugwu ruo na ndịda.5Mgbe ahụ, mmadụ niile ga-amata na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị amịpụtala mma agha m site nʼọbọ ya, ọ gaghị amịghachi baa nʼọbọ ọzọ.’6“Nʼihi ya, sụọ ude, nwa nke mmadụ, sụọ ude nʼihu ha nʼọnọdụ oke mwute na obi mgbawa.7Mgbe ha jụrụ gị, ‘Gịnị kpatara i ji asụ ude?’ Ị ga-asị, ‘Nʼihi ozi nke na-abịa. Obi niile ga-agbaze site nʼegwu, aka niile ga-akụdakwa; mmụọ niile ga-ada mba,ikpere niile ga-ede mmiri site nʼamịrị.’ Ọ na-abịa, ọ ghaghị imezu, otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya.”8Ọzọkwa, okwu Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,9“Nwa nke mmadụ buo amụma sị, ‘Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru:“ ‘Lee, mma agha, lee, mma agha,a mụọla ya, hichakwaa ya.10Amụọla ya nʼihi oke ogbugbu nke gaje ịdị,hichakwaa ya nke ọma ka ọ na-egbu dịka amụma.“ ‘Anyị ọ ga-aṅụrị ọṅụ na mkpara eze nwa m nwoke Juda? Mma agha na-elelị mkpara niile dị otu a anya.11“ ‘E nyere iwu ka e hichazie mma agha ahụ,ka e jidekwa ya nʼaka.A mụọla ya, hichazie ya.E doziela ya maka onye ahụ ga-eji ya laa ndụ nʼiyi.12Nwa nke mmadụ, tie mkpu akwa ma kwasie akwa ike,nʼihi na ọ bụ megide ndị mọ bụkwa megide ndịisi Izrel niile.A na-atụnyere ha mma agha ga-egbu ha,ha na ndị m.Nʼihi ya, tie aka gị nʼobi gị.13“ ‘Ọnwụnwa aghaghị ịbịa. Ma gịnị ga-eme, ma ọ bụrụ na mkpara eze nke mma agha na-elelị anya, agaghị nʼihu na-adịgide? Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri.’14“Nʼihi ya, buo amụma, nwa nke mmadụ.Kụkọọ ọbụ aka gị abụọ,ka mma agha gbuo ugboro abụọe, ọ bụladị ugboro atọ.Ọ bụ mma agha e debere maka ogbugbu,nke e debere maka oke ogbugbunke ga-abịachibido ha gburugburu.15Ka obi ha gbazee site nʼegwu,ka ndị na-ada ada hie nne,nʼihi na edoziela m mma agha ahụ nʼọnụ ụzọ ama ha niilemaka oke ogbugbu.Lee, mma agha ahụ na-egbu amụma,etinyela ya nʼaka onye ga-egbu oke ogbugbu.16Gị mma agha, ebe ọbụla ị chọrọ, ebe ọbụla i nwere ike, gbuo onye ọbụla,ma ọ nọ gị nʼaka nrima ọ nọ gị nʼaka ekpe.17Mụ onwe m ga-akụkọtakwa ọbụ aka m,ime ka iwe m jụrụ.Mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.”18Okwu nke Onyenwe anyị ruru m ntị, sị,19“Nwa nke mmadụ mee ụzọ abụọ nke mma agha eze Babilọn ga-eso. Ka ụzọ abụọ ndị a malite nʼotu obodo. Dee ihe ngosi manye ha nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ.20Mee ka otu nʼime ụzọ ndị ahụ bụrụ ebe mma agha ga-esi bịa megide Raba nke Amọn, ka nke ọzọ megide Juda na Jerusalem, bụ ebe e wusiri ike.21Nʼihi na eze Babilọn ga-abịa guzo nʼebe ahụ ụzọ wara abụọ,nʼisi ụzọ abụọ ahụ ịchọ ihe ama. Ọ ga-esite nʼịgba àkụ nke ife nza, jụọ ase site nʼaka arụsị ya niile, nyochakwaa umeju ahụ.22Nʼụzọ dị nʼaka nri, ka ihe ịjụ ase banyere Jerusalem ga-esi bịa. Nʼebe ahụ ka ọ ga-ewu ihe niile ha ji etida mgbidi obodo ahụ. Nʼebe ahụ ka ọ ga-anọ nye iwu maka igbuchapụ ndị niile, na iwu ido ihe e ji etipu mgbidi nʼọnụ ụzọ ama niile, na iwu a ga-eji wuo nkwasa agha na mgbidi e ji ebuso ya agha.23Ọ ga-adị ha dịka ọjụjụ ase nke na-abaghị uru, nye ndị ahụ ṅụrụ ha iyi, ma ọ ga-echetara ha ihe ọjọọha mere, dọkpụrụ ha nʼike.24“Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru. ‘Ebe ọ bụ na unu esitela na nnupu isi unu mee ka e cheta ajọ omume unu, si otu a na-ekpughe mmehie unu nʼihe niile unu na-eme. Ebe ọ bụ na unu emeela ihe dị otu a, a ghaghị ịdọta unu nʼagha.25“ ‘Gị onye rụrụ arụ, onye na-emebi iwu, gị nwa eze nʼIzrel, gị onye ụbọchị ahụhụ ya rurula,26ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị, yipụ okpueze gị, ya na akwa ị na-atụghị nʼisi. Ihe agaghị adịkwa dịka o si adị na mbụ. A ga-ebuli ndị dị ala, wedata ndị dị elu.27Mbibi, mbibi. Aga m eme ka ọ ghọọ ihe e bibiri ebibi. A gaghị eweghachikwa ya ọzọ tutu ruo mgbe onye ahụ o ruuru nʼizi ezi bịara. Ya ka m ga-enyefe ya nʼaka.’28“Ma gị onwe gị, Nwa nke mmadụ, buo amụma kwuo, ‘Ihe ndị a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwuru megide ndị Amọn nʼihi ịkwa emo ha:“ ‘Lee mma agha, lee mma agha,nke a mịpụtara maka oke ogbugbu.E hichaziela ya mee ka ọ dị nkọ iripịa,ka ọ na-egbu amụma dịka amụma egbe eluigwe.29Nʼagbanyeghị ọhụ ụgha nke a na-ahụ banyere unu,na a jụtakwala ase ụgha banyere unu,a ga-etinye ya nʼolundị mmebi iwu ahụ a gaje igbu egbu,bụ ndị ụbọchị ha rurula,ndị oge ịta ahụhụ ha zukwara.
30“ ‘Mịghachinụ ya nʼọbọ ya.Nʼebe ahụ e kere ununʼala nna nna unu ha,Aga m ekpe unu ikpe.31Aga m awụkwasị unu ọnụma m,kukwasịkwa unu ikuku nke oke iwe m.Aga m ewere unu nyefee nʼaka ndị na-eme ihe ike,ndị bụ ọka na ịla mmadụ nʼiyi.32Unu ga-aghọkwa mmanụ a na-awụnye nʼọkụ.A ga-awụsịkwa ọbara unu nʼala unu.Ọ dịkwaghị onye ga-echeta unu ọzọ,nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị ekwuola.’ ”