1Ezi aha ka mma karịa mmanụ isi ụtọ.Ụbọchị mmadụ nwụrụ ka ụbọchị a mụrụ ya mma.2Ọ kaara gị mma ije nʼebe a na-eru ụjụkarịa ebe a na-eri na-aṅụ.Nʼihi na ọnwụ dịịrị mmadụ ọbụla;ndị dị ndụ kwesiri iburu nke a nʼobi.3Iru ụjụ ka ịchị ọchị mma,ihu gbarụrụ agbarụ na-enyere obi aka4Onye maara ihe na-eche echiche banyere ọnwụ,ma onye nzuzu na-eche naanị banyere ikpori ndụ.5Ọ ka mma ige ntị nye mba onye maara ihekarịa ịṅa ntị nʼabụ ndị na-enweghị uche na-abụ.6Ọchị onye nzuzudị ka mkpọtụ nke ogwu na-ere ọkụ na-eme nʼokpuru ite.Ihe a bụkwa ihe efu.7Iji anya ike nara mmadụ ihe na-eme ka onye mara ihe ghọọ onye nzuzu,iri ngarị na-emerụ obi mmadụ.8Ọgwụgwụ ihe ọbụla dị mma karịa mmalite ya!Ogologo ntachiobi dị mma karịa mpako!9Abụla onye na-ewe iwe ọsịịsọ,nʼihi na iwe bụ oke ndị nzuzu.10Asịla, “Gịnị mere ụbọchị gara aga ji dị mma karịa ụbọchị ndị a?”Nʼihi na ọ bụghị amamihe ị jụ ajụjụ dị otu a.11Amamihe dịka ihe nketa, bụ ihe dị mma.Ọ na-abara uru nye ndị na-ahụ anyanwụ anya.12Amamihe bụ ndodịka ego si bụrụkwa ndo,ma ụzọ ihe ọmụma ji dị mma karịa bụ nke a:Amamihe na-echebe ndụ ndị nwere ya.13Chee echiche banyere ihe Chineke na-eme.Mmadụ ọ pụrụ ime ka ọ dịzie adịzie,bụ ihe Chineke mere ka ọ gbagọọ agbagọ?14Mgbe ihe na-agara gị nke ọma, ṅụrịa ọṅụ, nʼihi ọ dịrị gị mma,ma mgbe mmekpa ahụ batara, mata nke ọmana Chineke onye na-enye ọnọdụ ọmamakwa ihe banyere ọnọdụ ọjọọ.Ya mere, o nweghị onye ọbụla nwere ike ịchọpụtaọdịnihu ya.15Ndụ m nʼụwa a bụ ihe efu, ahụla m ihe abụọ ndị a;onye ezi omume na-anwụ nʼezi omume ya,ma onye na-emebi iwu na-ebi ogologo ndụ na mmebi iwu ya.16Nʼihi ya, abụbigala onye ezi omume oke,emekwala onwe gị onye mabigara ihe oke.Gịnị mere i ji achọ igbu onwe gị?17Abụbigala onye na-emefe ajọ omume oke,abụkwala onye nzuzu!Gịnị ka ị ga-eji nwụọ mgbe oge gị na-erubeghị?18Ọ dị mma ijide otuna-esepụghị aka na nke ọzọ,onye na-atụ egwu Chineke ga-enweta uru nʼime ha abụọ.19Amamihe na-eme ka otu onye dị ikekarịa mmadụ iri na-achị otu obodo.20Gbaa ụwa niile gburugburu, ọ dịghị otu onye bụ onye ezi omume,ọ dịghị onye na-eme ihe ziri ezi nke na-adịghị eme mmehie mgbe ọbụla.21Egela ntị nʼihe niile ndị mmadụ na-ekwu,ị pụrụ ịnụ nkọcha nke ohu gị na-akọcha gị.22Gị onwe gị maarana ọtụtụ oge, ị na-akọchakwa ndị ọzọ.23Agbalịsiela m ike inwe nghọta. Ekwuru m sị,“Aga m abụ onye amamihe,”ma nke a karịrị m.24Amamihe adịghị mfe inweta, ọ dị omimi nke ukwuu;ọ bụ onye pụrụ ịchọpụta ya?25A tụgharịrị uche m ka m ghọta,iledo na ịchọpụta amamihe na atụmatụ otu ihe niile si dịna ịghọtakwa nzuzu nke dị na ajọ omumena ịyị ara nke dị na enweghị uche.26Achọpụtara m na ọ dị ihe dị ilu karịa ọnwụ,ihe ahụ bụ nwanyị.Obi ya dị ka ụgbụ.Otu a kwa, aka o ji ejikụ gị dị ka ụdọ igwe.Onye ahụ na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ na-esi nʼaka ya gbapụ,ma ndị mmehie ka ọ na-enwude nʼọnya ya.27“Lee, Ihe a ka m chọpụtara,” ka onye nkuzi kwuru:“Site nʼịtụkwasị otu ihe nʼelu ibe ya ka m matara isi ihe niile.28Mgbe m ka na-achọma achọtaghị m,nʼetiti puku mmadụ ndị ikom, achọtara m otu onye aka ya dị ọcha,ma ọ dịghị otu nwanyị m chọtara nʼetiti ha.29Achọpụtara m naanị nke a,Chineke mere ndị mmadụ ka ha bụrụ ndị ụzọ ha ziri ezi,ma ha atụgharịala chọrọ ọtụtụ ihe nchepụta gawa.”