Ekiliziastis12ibo_bib

1Ya mere, cheta Onye kere gịmgbe ị ka bụ okorobịa,tupu ụbọchị ọjọọ ndị ahụ abịa,na mgbe afọ aka abịarubeghịmgbe ị ga-asị, “Ha anaghị atọkwa m ụtọ.”2Tupu anyanwụ na ìhè,ọnwa na kpakpando ga-agba ọchịchịrị,na nlọghachi igwe ojii mgbe mmiri zosiri.3Mgbe ndị na-echebe ụlọ ga-ama jijiji,mgbe ndị dimkpa nwoke ga-ehulata,mgbe ndị na-akwọ ihe kwụsịrị maka ha dị ole na ole,mgbe ndị na-elepụ anya site nʼoghere ga-ebido ịgba ọchịchịrị,4mgbe e mechiri ọnụ ụzọ nke pụrụ nʼokporoụzọ,mgbe olu ịkwọ nri ga-adị ala,mgbe ụda olu abụ ụmụ nnụnụ ga-akpọte ndị mmadụ,ma abụ ha niile na-ala ala,5mgbe ndị mmadụ ga-atụ egwu ebe dị elu;na ihe egwu nke okporoụzọ,mgbe osisi alụmọnd ga-ama ifurumgbe ụkpana ga na-adọkpụ onwe ya nʼụzọ,agụụ ihe ọbụla ga-akwụsịkwa.Mgbe ahụ, ndị mmadụ ga-ala ụlọ ebighị ebi ya,ndị na-akwa akwa ga na-agagharị nʼokporoụzọ niile.
6E, cheta ya, tupu e gbubie ụdọ ọlaọcha ahụ,tupu e tiwaa ọkwa ọlaedo,tupu ite adawaa nʼisi iyi,tupu e tijie ụkwụ igwe olulu mmiri.7Mgbe ahụ, anụ ahụ anyị ga-alaghachi nʼaja ebe o si pụta;mmụọ anyị ga-alaghachikwuru Chineke onye nyere ya.
8“Ihe efu! Ihe efu!” ka onye ozizi kwuru.“Ihe niile bụ ihe efu!”

Nchịkọta okwu niile

9Ọ bụghị naanị nʼonye ozizi ahụ bụ onye maara ihe, o jegharịrị na-ezi ndị mmadụ ihe ọ maara. Ọ tụgharịrị uche chọpụta ọtụtụ ilu, detuokwa ha nʼusoro.10Onye ozizi chọpụtara okwu ndị dabanyere nʼusoro, ihe o depụtara bụ ihe ziri ezi na eziokwu.11Okwu ọnụ nke onye maara ihe dị ka ndụdụ e ji achụ ehi. Nchịkọta okwu amamihe ndị a dị ka ǹtu a kumiri nke ọma, nke onye na-azụ atụrụ nyere.12Ma nwa m nwoke lezie anya, atụkwasịla ihe ọzọ nʼelu ihe ndị a. Akwụkwọ a na-ede ede enweghị ọgwụgwụ, ọtụtụ mmụta na-agwụ ike.13Ugbu a anụla ihe ndị a niile,ma nụrụ ihe bụ nkwubi okwu:Tụọ egwu Chineke, debekwa iwu ya niile,nʼihi na nke a bụ ọrụ niile dịrị mmadụ.14Nʼihi na Chineke ga-ekpe ọrụ ọbụla ikpe,ya na ihe nzuzo anyị niile,ma ha dị mma ma ha dị njọ.