Emọs9ibo_bib

A ga-ebibi Izrel

1Ahụrụ m Onyenwe anyị ka ọ guzo nʼakụkụ ebe ịchụ aja, ọ sịrị,“Tie ọnụ ogidi ndị a ihe,ruo mgbe mbata ọnụ ụzọ ha niile mara jijiji.Tipịasịa ha nʼisi mmadụ niile;aga m ejikwa mma agha gbuo ndị niile fọdụrụ.Ọ dịghị onye ga-agbapụ,ọ dịkwaghị onye ga-ewezuga onwe ya.2Ọ bụrụ na ha egwuo ala ruo nʼala mmụọ,site nʼebe ahụ ka aka m ga-esi dọlie ha,ọ bụrụkwa na ha arịgoruo ime eluigwe,site nʼebe ahụ ka m ga-esi wedata ha nʼala.3Ọ bụrụkwa na ha ezoo onwe ha nʼelu Kamelnʼebe ahụ ka m ga-esi chọpụta ha, kpụrụ ha,a sịkwa na ha ezoo onwe ha nʼala oke osimiri,nʼebe ahụ ka m ga-enye ajụala nke mmiri iwu ka ọ taa ha.4Ọ bụrụ na a dọta ha nʼagha mee ka ha gaa biri nʼala ndị mba ọzọ,nʼebe ahụ aga m enye mma agha iwu ka o gbuo ha.“Aga m elekwasị ha anya m abụọnʼihi ime ha ihe ọjọọ, ọ bụghị ihe ọma.”
5Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,onye na-emetụ ala aka mee ka ọ gbazee,ime ka ndị niile bi nʼala ruo ụjụ;ala ya niile bilie na-ebili dịka mmiri nke osimiri Naịl,nke na-emesịakwa dajụọ dịka mmiri Ijipt.6Onye na-ewu ụlọ elu ya nʼeluigwe niile,na-eme ka ntọala ya dị nʼụwa.Onye na-akpọ mmiri nke osimiri oku,ma na-awụsa ha nʼala,aha ya bụ Onyenwe anyị.
7“Ọ bụ na unu ndị Izreladịghị ka ndị Kush nʼebe m nọ?”Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.“Ọ bụ na-esighị m nʼala Ijipt kpọpụta Izrel,site na Kafto kpọpụta ndị Filistia,ma kpọpụtakwa ndị Aram site na Kia?
8“Nʼezie, anya Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị dịkwasịrịnʼahụ alaeze ahụ nke na-emehie.Aghaghị m ịla ya nʼiyi,kpochapụ ya site nʼelu ụwa,naanị na m agaghị ebibichaụlọ Jekọb kpamkpam.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.9“Ma lee, mụ onwe m gaje inye iwu,aga m ayọgharị ụlọ Izrelnʼetiti mba niiledịka e si ayọgharị ọka nʼime nyọ,ma ọ dịghị otu mkpụrụ ọka nʼime ya nke ga-ada nʼala.10Ma ndị mmehie ahụ niile nọ nʼetiti ndị m,ndị ahụ na-asị, ‘Mbibi agaghị erute anyị,anyị agaghị ezute ya,aghaghị ịnwụ site na mma agha.’

Nlọta ndị Izrel

11“Nʼụbọchị ahụ,“aga m emekwa ka ụlọ ikwu Devid dara ada guzoziekwa.Aga m emezi akụkụ ya niile gbajiri agbaji,mee ka akụkụ ya niile dakpọsịrị adakpọsị guzozie dịka ọ dị na mbụ.Aga m ewugharịkwa ya, mee ka ọ dịrị ka ọ dị na mbụ.12Ka ha nwee ike inweta ndị fọdụrụ nʼEdọmtinyere mba niile dị iche iche bụ nke a kpọkwasịrị aha m.”Otu a ka Onyenwe anyị onye ga-emezu ihe ndị a niile kwubiri ya.13“Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri,“Mgbe onye na-akọ ubi ga-agafe onye na-ewe ihe ubi,onye na-agha mkpụrụ ka onye na-azọcha mkpụrụ vaịnị ga-agafekwa.Mmanya ọhụrụ ga-esitekwa nʼelu ugwu na-atapụta,ọ ga-esitekwa nʼugwu nta niile na-asọpụta.14Aga m emekwa ka ndị m bụ Izrel site nʼobodo a dọtara ha nʼagha lọta.“Ha ga-ewugharị obodo niile tọgbọrọ nʼefu, birikwa nʼime ha.Ha ga-akụ ubi vaịnị a gbara ogige, ṅụọkwa mmanya si na ya.Ha ga-arụkwa ubi a gbara ogige, riekwa mkpụrụ si na ya.15Aga m akụ Izrel nʼala ha.A gaghị ehopukwa ha ọzọsite nʼala ahụ bụ nke m nyere ha.”Ọ bụ ihe Onyenwe anyị Chineke unu kwuru.