1Ihe a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị gosiri m. Otu nkata nke mkpụrụ osisi ọkọchị chara acha jupụtara.2Ọ sịrị m, “Emọs, gịnị ka ị na-ahụ?” A sịrị m: “Otu nkata nke mkpụrụ osisi chara acha jupụtara nʼime ya.” Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị m, “Oge ọgwụgwụ abịakwasịla ndị m, Izrel. Agaghị m ewezugakwa ntaramahụhụ dịrị ha.”3Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwupụtara, “Nʼụbọchị ahụ, abụ niile nke a na-abụ nʼime ụlọnsọ ukwu ga-aghọ iti mkpu akwa. Ọtụtụ, ọtụtụ ozu ndị nwụrụ anwụ, nʼebe niile ọbụla ka atụpụsịrị ha! Mkpọtụ ọbụla adịghịkwa!”4Nụrụnụ nke a, unu ndị na-azọpịa ndị mkpa na-akpa,na-emekwa ka ụmụ ogbenye dị nʼala a gwụsịa,5na-asị,“Olee mgbe ọnwa ọhụrụ ga-agafeka anyị ree mkpụrụ ubi,na mgbe ụbọchị izuike ga-agwụka anyị ree ọka wiiti?”Ka anyị jiri ihe ọtụtụ dị nta,na ibuli ọnụ ngwa ahịa elu,na aghụghọ site nʼiji ihe ọtụtụ na-ezughị ezu.6Jiri ọlaọcha zụta ụmụ ogbenye,jirikwa akpụkpọụkwụ abụọ anyị zụta ndị mkpa na-akpa,ma reekọta ọka wiiti anyị zachatara nʼala ya na ezi ọka wiiti.7Onyenwe anyị ewerela nganga Jekọb ṅụọ iyi, “Nʼezie, agaghị m echefu, ọ bụladị otu nʼime ọrụ niile ha rụrụ.”8Ọ bụ na ala agaghị ama jijiji nʼihi nke a,ndị niile bi nʼime ya ha agaghị eru ụjụ?Ala a niile ga-etoju dịka osimiri Naịl,a ga-eme ka ọ magharịa malie elu, ma tachaadịka iyi Ijipt.9“Ma nʼụbọchị ahụ,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,“Aga m eme ka anyanwụ daa nʼetiti ehihie,ime ka ọchịchịrị dịrị nʼetiti oke ehihie nke ụbọchị.10Aghaghị m ime ka ụbọchị oke oriri unu ghọọ ụbọchị iru ụjụ;gbanwee abụ unu niile ka ha ghọọ abụ akwa.Aga m eme ka onye ọbụla nʼime unu yiri akwa mkpe,meekwa ka unu kpụchaa isi unu.Aga m eme ka ụbọchị ahụ dịrị ka ụbọchị a na-eru ụjụ, nʼihi otu mkpụrụ nwa nwoke nwụrụ anwụ.Ọgwụgwụ ya ga-adịka ụbọchị na-elu ilu ilu.11“Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị kwubiri ya,“mgbe m ga-eziga oke ụnwụ nʼelu ala,ọ bụghị ụnwụ nke nri maọbụ nke akpịrị ịkpọ nkụ nke mmiri,kama ọ bụ oke ụnwụ nke ịnụ okwu niile nke Onyenwe anyị.12Ha ga-awagharị site nʼotu osimiri ruo nʼosimiri ọzọ,sitekwa nʼugwu ruo nʼọwụwa anyanwụ;ha ga-agbagharị nʼelu na ala ịchọ okwu Onyenwe anyị,ma ha agaghị achọta ya.13“Nʼụbọchị ahụ,“ụmụ agbọghọ ndị mara mma ile anya, na ụmụ okorobịa ndị dị ikega-ada mba nʼihi akpịrị ịkpọ nkụ.14Ndị ahụ na-eji mmehie Sameria na-aṅụ iyi,ndị na-asị, ‘Dịka chi gị na-adị ndụ, gị Dan,’nakwa, ‘Ebe ọ bụ na chi ndị Bịasheba na-adị ndụ,’ha ga-ada, ha agakwaghị ebilite ọzọ.”