Emọs2ibo_bib

1Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,“Nʼihi njehie atọ nke Moab,e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.Nʼihi na ha surere ọkpụkpụ eze ndị Edọm ọkụ,mee ha ka ha ghọọ ntụ.2Ya mere, aga m ezite ọkụ na Moab,nke ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Keriọt.Moab ga-anwụ nʼime ọgbaaghara,nʼetiti mkpu agha, na ụda opi ike.3Aga m ala onyeisi ọchịchị ya nʼiyi,gbukwaa ndị ozi niile nọ nʼokpuru ya.”Ọ bụ Onyenwe anyị na-ekwu.4Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,“Nʼihi njehie atọ nke Juda,e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.Nʼihi na ha ajụla iwu Onyenwe anyị.Ha ajụkwala irube isi ha nʼụkpụrụ ya.Ha abụrụla ndị e ji okwu ụgha duhie,bụ okwu ụgha ndị ahụ nna nna ha gbasoro.5Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na Juda,ọ ga-erepịa ebe niile e wusiri ike nke Jerusalem.”

Ikpe ọmụma dịrị Izrel

6Otu a ka Onyenwe anyị sịrị,“Nʼihi njehie atọ nke Izrel,e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.Ha na-ere ndị ezi omume nʼihi ọlaọcha,reekwa ụmụ ogbenye nʼọnụ ahịa e ji azụ akpụkpọụkwụ abụọ.7Ha na-azọpịa isi ndị ike na-adịghị,na-echi ha ọnụ nʼaja,na-ewezuga ndị dị umeala nʼụzọ ezi ihe.Nwoke na nna ya na-edinakwuru otu nwaagbọghọ,si otu a merụọ aha nsọ m.8Ha na-edina nʼakụkụ ebe ịchụ aja ọbụla,nʼelu uwe ndị anatara na mbe.Nʼime ụlọnsọ chi ha,ha na-aṅụ mmanya ha natara dịka ihe nra.
9“Ma a lara m ndị Amọrait nʼiyi nʼihu ha,ndị ahụ dị ogologo dịka osisi sida,ndị sikwara ike dịka osisi ook.Alara m mkpụrụ ha dị nʼelu,na mgbọrọgwụ ha niile dị nʼokpuru nʼiyi.10Esitere m nʼala Ijipt kpọpụta unu,duru unu gafee nʼọzara iri afọ anọ,ime ka unu nweta ala ndị Amọrait.
11“Ahọpụtara m ụmụ unu ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,họpụtakwa ụfọdụ ndị okorobịa unu ka ha bụrụ Nazirait.Unu ndị Izrel, unu ga-agọ na nke a abụghị eziokwu?”Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya.12“Ma unu mere ka ndị Nazirait ahụ ṅụọ mmanya.Unu nyekwara ndị amụma iwu ka ha kwụsị ibu amụma.
13“Nʼihi ya, aga m abịada unu nʼala nʼọnọdụ unu,dịka ụgbọala nke e bujuru ukwu ọka si abịada.14Ịgba ọsọ agaghị azọpụta ọ bụladị ndị dị nwe ụkwụ ọsọ,ndị dị ike agaghị agba onwe ha ume,ndị bụ dike nʼagha agaghị azọpụta onwe ha.15Ndị na-agba ụta agaghị agbata ihe ọbụla,ndị nwere ụkwụ ọsọ agaghị enwekwa ike ịgba ọsọ.Ọ bụladị onye ịgba ịnyịnya doro anya agakwaghị enwe ike ịgbanarị ihe mberede nke ga-abịakwasị ya.16Ndị obi siri ike nʼetiti ndị dike unu,ga-agbara ọtọ gbapụ ọsọ nʼụbọchị ahụ.”Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.