Emọs1ibo_bib

1Okwu ndị Emọs kwuru, onye bụ otu nʼime ndị ọzụzụ atụrụ nke obodo Tekoa. Ndị a bụ ọhụ ọ hụrụ banyere Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a mgbe Uzaya bụ eze ndị Juda. Nʼoge ahụ kwa ka Jeroboam nwa Joash na-achị Izrel. Ọ hụrụ ọhụ a afọ abụọ tupu oke ala ọma jijiji ahụ adịrị.
2Ọ sịrị,Onyenwe anyị si nʼugwu Zayọn na-ebigbọ,o si na Jerusalem na-eme ka olu ya daa ụda.Ebe ịta nri nke ndị ọzụzụ atụrụ ga-eru ụjụ.Elu ugwu Kamel ga-akpọnwụkwa.

Ikpe ọmụma dịrị ndị agbataobi Izrel

3Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,“Nʼihi njehie atọ nke Damaskọs,na nʼihi njehie ha nke ugboro anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.Nʼihi na ha azọpịala ndị m nʼime Gilead,ha ji igwe ịzọcha mkpụrụ ọka nwere eze.4Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ nʼụlọeze Hazael;ọkụ a ga-erepịakwa ebe niile e wusiri ike nke Ben-Hadad.5Aga m etiji ibo ọnụ ụzọ ama Damaskọs,aga m ekpochapụkwa ndị niile bi na Ndagwurugwu Aven,na onye ahụ mkpara eze dị nʼaka ya, nke nọ na Bet-Eden.Ndị Aram ga-abụkwa ndị a dọtara nʼagha, ndị a ga-adọkpụrụ gaa Kia.”Ka Onyenwe anyị kwuru.6Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,“Nʼihi njehie atọ nke Gaza,e, nʼihi njehie nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ,nʼihi na ha dọtara mmadụ niile nʼagha,ranye nʼaka ndị Edọm.7Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Gaza,ebe ya niile e wusiri ike ga-agba ọkụ.8Aga m egbu ndị Ashdọd,ma bibiekwa onye ahụ na-achị Ashkelọn.Aga eweli aka m megide ndị Ekrọn,ruo mgbe ndị Filistia fọdụrụ ga-ala nʼiyi.”Otu a ka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị sịrị.9Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,“Nʼihi njehie atọ nke Taịa,e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.Nʼihi na ha dọkpụrụ ọgbakọ ndị mmadụ renye nʼaka Edọm dịka ohu,ma chefuo ọgbụgba ndụ nwanne na nwanne dị nʼetiti ha.10Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Taịa;ọ ga-eredakwa ebe ha niile e wusiri ike.”11Onyenwe anyị na-ekwu,“Nʼihi njehie atọ nke Edọm,e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ.Nʼihi na o ji mma agha chụọ nwanne ya ọsọ,o meghị ebere,kama, o mere ka iwe ya dịgidesie ike;nrubiga oke nke ọnụma ya akwụsịkwaghị akwụsị.12Nʼihi ya, aga m esunye ọkụ na Teman;ọ ga-erekwa nʼebe niile e wusiri ike nke Bozra.”13Ma otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu,“Nʼihi njehie atọ nke Amọn,e, nʼihi nke anọ, agaghị m ahapụ inye ya ntaramahụhụ,nʼihi na ha were mma agha ha bọwaa afọ ụmụ nwanyị Gilead dị ime,nʼihi ime ka oke ala ha saa mbara.14Nʼihi nke a, aga m esunye ọkụ na mgbidi niile nke Raba.Ọ ga-erepịakwa ebe ya niile e wusiri ike.Oke ụzụ agha nke ga-ada dịka ụzụ oke ifufe,na ụzụ egbe eluigwe ga na-ada nʼụbọchị ahụ.15Eze ha na ndịisi ọchịchị ya ga-abụ ndị a dọtara nʼagha,ndị ga-aga biri nʼala ọzọ.”Ka Onyenwe anyị sịrị.